Mb͕e ahu ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ siri na Jerusalem biakute Jisus, si, N'ìhi gini ka ndi nēso uzọ-Gi nējehie n'ozizí ndi-okenye nyere ayi n'aka idebe? n'ihi na ha adighi-akwọ aka mb͕e ọ bula ha nēri nri. Ma Ọ zara, si ha, N'ìhi gini ka unu onwe-unu nējehie kwa n'ihe Chineke nyere n'iwu n'ihi ozizí enyere unu n'aka? N'ihi na Chineke siri, Sọpuru nna-gi na nne-gi: na, Onye kwujọrọ nna maọbu nne, ya nwua ọnwu ahu. Ma unu onwe-unu nāsi, Onye ọ bula nke gāsi nna-ya ma-ọbu nne-ya, Ihe ọ bula i gēritari n'akam bu ihe enyere Chineke; ọ gaghi-asọpuru nna-ya ma-ọbu nne-ya ma-ọli. Unu nēme kwa okwu Chineke ka ọ buru ihe-efu n'ihi ozizí enyere unu n'aka idebe. Ndi-iru-abua, Aisaia buru amuma nke-ọma bayere unu, si,
Ndi nka nāsọpurum n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha;
Ma obi-ha di anya n'ebe M'nọ.
Ma ha nēbirim isi ala n'efu,
Nēzì ihe madu nyere n'iwu ka ha buru ozizí-ha.
O we kpọ ìgwè madu ahu biakute Ya, Ọ si ha, Nurunu, ghọta-kwa-nu: Ọ bughi ihe nābà n'ọnu nēmeru madu; kama ihe si n'ọnu puta, ọ bu nke ahu nēmeru madu. Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya biakutere Ya, si Ya, Ì matawo na emere ka ndi-Farisi ma n'ọnyà, mb͕e ha nuru okwu ahu? Ma Ọ zara, si, Agēropu ihe-ọkukú ọ bula nke Nnam nke elu-igwe nākughi. Rapunu ha: ha bu ndi-ndú kpuru ìsì. Ma ọ buru na onye-ìsì edu onye-ìsì, ha abua gādabà n'olùlù. Pita we za, si Ya, Kọrọ ayi isi ilu a. O we si, Ùnu onwe-unu di kwa nēnweghi nghọta we rue ub͕u a? Ùnu atugharighi uche-unu na ihe ọ bula nke nābà n'ọnu nāga n'afọ, ewe nyupu ya n'ulo-ǹsí? Ma ihe nke si n'ọnu puta nēsi nime obi aputa; ihe ndia nēmeru kwa madu. N'ihi na n'obi ka ajọ èchìchè nile, ib͕u-madu nile, ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, ikwa-iko nile, ori nile, àmà ugha nile, nkwulú nile, si aputa: ndia bu ihe nēmeru madu: ma iwere aka anākwọghi akwọ iri ihe adighi-emeru madu.