Ma mb͕e Jisus nuru ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya n'ub͕ọ, je iche rue ebe bu ọhia: mb͕e ìgwè madu nile nuru ya, ha we si n'obodo ahu nile so Ya n'ukwu ala. O we puta, hu oké ìgwè madu, O we nwe ọmiko n'aru ha, me ndi-nriaria-ha ka aru-ha di ike. Ma mb͕e o ruru anyasi, ndi nēso uzọ-Ya biakutere Ya, si, Ebe a bu ọhia, oge agawo kwa ub͕u a; zilaga ìgwè madu ndia, ka ha we je n'obodo ntà nile buruburu, zuru onwe-ha ihe-oriri. Ma Jisus siri ha, Ọ dighi ha nkpà ka ha la; unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie. Ha we si Ya, Ayi enweghi n'ebe a ma-ọbughi ob͕e achicha ise na azù abua. O we si, Chita ha n'ebe a nyem. O we gwa ìgwè madu nile ka ha nọdu n'elu ahihia; O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n'elu-igwe, gọzie ha, nyawaha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ob͕e achicha ahu, ndi nēso uzọ-Ya nēnye kwa ìgwè madu nile. Ha nile we rie, afọ ju-kwa-ra ha: ha we tutukọ nke fọduru nime iberibe ahu, nkata iri na abua juru. Ma ndi riri ra ka nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri, nāgughi ndinyom na umu-ntakiri.
Gụọ MATIU 14
Geere nke a ntị MATIU 14
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MATIU 14:13-21
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị