N'oge ahu Jisus gara n'etiti ubi ọka n'ubọchi-izu-ike; ma agu nāgu ndi nēso uzọ-Ya, ha we malite ighọ oko ọka, na ita ya. Ma ndi-Farisi, mb͕e ha huru ya, ha si Ya, Le, ndi nēso uzọ-Gi nēme ihe nēzighi ezi n'iwu ime n'ubọchi-izu-ike. Ma Ọ siri ha, Ùnu agughi ihe Devid mere, mb͕e agu guru ya, na ndi soro ya; otú ọ batara n'ulo Chineke, rie ob͕e achicha anēche n'iru Chineke, nke nēzighi ezi n'iwu ka o rie, ma-ọbu ndi so ya, kama ọ bu nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi? Ma-ọbu ùnu agughi n'iwu, na ndi-nchu-àjà nēmeru ubọchi-izu-ike n'ulo uku Chineke n'ubọchi-izu-ike, ma adighi-ata ha uta? Ma asim unu, na Onye di uku kari ulo Chineke nọ n'ebe a. Ma ọ buru na unu marari ihe okwu a bu, Anamachọ ebere, ọ bughi àjà, unu agaghi-ekpeb͕u ndi adighi-ata ha uta. N'ihi na Nwa nke madu bu Onye-nwe ubọchi-izu-ike.
O we si n'ebe ahu pua, ba n'ulo-nzukọ-ha: ma le, otù nwoke nke nwere aka kpọnwuru akpọnwu. Ha we jua Ya, si, Ò ziri ezi n'iwu ime ka aru madu di ike n'ubọchi-izu-ike? ka ha we bo Ya ebubo. ma Ọ siri ha, Òle madu gādi n'etiti unu, nke gēnwe otù aturu, ma ọ buru na aturu ahu adabà nime olùlù n'ubọchi-izu-ike, ọ̀ gaghi-ejide ya, dọgoputa ya? Òle kwa ka ọ ra, bú otú ọnu-ahia madu kariri nke aturu oké ọnu! Ya mere o ziri ezi n'iwu ime ihe ọma n'ubọchi-izu-ike. Mb͕e ahu Ọ si nwoke ahu, Setipu aka-gi. O we setipu ya; ewe me ka aka-ya di nma, dika nke-ọzọ. Ndi-Farisi we pua, b͕a izù imegide Ya, ka ha gēsi la Ya n'iyì. Ma ebe Jisus mara ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya: ọtutu madu we so Ya; O we me ka aru di ha nile ike, O we dọ ha aka na nti ka ha ghara ime ka Ọ puta ìhè: ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si,
Le, Onye nējerem ozi Onye M'rọputara;
Onye M'huru n'anya, Onye ihe-Ya di nkpuru-obim ezi nma:
M'gātukwasi Ya Mọ nkem,
Ọ gākọ-kwa-ra mba nile akukọ ikpé.
Ọ gaghi-alu ọ̀gù, Ọ gaghi-etisi kwa nkpu ike;
Ọ dighi kwa onye ọ bula gānu olu-Ya n'amá.
Ọ gaghi-akpaji ami apiara apia,
Ọ gaghi-emenyu kwa ogho-oriọna nākwu anwuru-ọku,
Rue mb͕e Ọ gātupu ikpé-Ya rue na nmeri.
Ọ bu kwa n'aha-Ya ka mba nile gātukwasi obi.
Mb͕e ahu ekutara Ya otù onye mọ ọjọ ji, bú onye kpuru ìsì nke da-kwa-ra ob͕i: O we me ka aru-ya di ike, ya mere onye-ob͕i ahu kwuru okwu hu kwa uzọ. Ibobo we nwua ìgwè madu ahu nile n'aru, ha we si, Nwoke a, Ọ̀ gābu nwa Devid?