Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 12:1-23

MATIU 12:1-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼoge ahụ, Jisọs sitere nʼubi a kụrụ ọka na-agafe nʼụbọchị izuike. Ma ebe agụụ na-agụ ndị na-eso ụzọ ya, ha malitere ịghọ ogbe ọka, na ịta mkpụrụ ya. Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Lee, ndị na-eso ụzọ gị na-eme ihe na-ezighị ezi ime nʼụbọchị izuike!” Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtaghị ihe Devid na ndị ya na ha soo mere mgbe agụụ na-agụ ha? Otu o si banye nʼụlọ Chineke, ya na ndị so ya, rie achịcha a na-eche nʼihu Chineke, nke na-ezighị ezi nʼiwu ka ha rie, kama ọ dịịrị naanị ndị nchụaja iri ya. Ka ọ bụ na unu agụtabeghị ebe e dere ya nʼime akwụkwọ iwu Mosis na ndị nchụaja na-emerụ ụbọchị izuike nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ma ọ dịghị onye na-ata ha ụta? Ma ana m agwa unu na onye dị ukwuu karịa ụlọnsọ ukwu nọ nʼebe a. Ọ bụrụ na unu ghọtara ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe ọ na-asị, ‘Ana m achọ ebere, ọ bụghị aja.’ Unu agaraghị ama ndị ikpe na-amaghị ikpe. Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe ụbọchị izuike.” O sitere nʼebe ahụ pụọ banye nʼụlọ nzukọ ha. Nʼebe a ka ọ hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ndị nọ nʼebe ahụ jụrụ ya ajụjụ sị, “O ziri ezi nʼiwu ịgwọ mmadụ nʼụbọchị izuike?” Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu nwere otu atụrụ danyere nʼime olulu nʼụbọchị izuike gịnị ka ọ ga-eme? Ọ ga-ahapụ ya nʼebe ahụ? Ọ gaghị ejide ya dọpụta ya? Mmadụ ọ dịghị mkpa karịa atụrụ? Ya mere, o ziri ezi nʼiwu bụ ịrụ ọrụ ọma nʼụbọchị izuike.” Mgbe ahụ ọ sịrị nwoke ahụ, “Setịpụ aka gị.” Nwoke ahụ setịpụrụ aka ya. Aka ahụ dịkwara ya mma dị ka aka nke ọzọ. Nʼihi nke a ndị Farisii sitere nʼebe ahụ pụọ, ga gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya. Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-ezube ime, o sitere nʼebe ahụ pụọ. Ma ọtụtụ ndị mmadụ sooro ya. Ọ gwọkwara ha nrịa nrịa ha niile. Ma o nyere ha iwu ka ha hapụ ịgwa ndị ọzọ onye ọ bụ. Nke a bụ ka emezuo okwu ahụ Aịzaya onye amụma kwuru, “Onye a bụ onye na-ejere m ozi, onye m họpụtara. Onye m hụkwara nʼanya. O bụkwa onye ihe ya na-atọ m ụtọ. Aga m etinye Mmụọ m nʼime ya. Ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka. Ọ gaghị ese okwu, ọ gaghị etisikwa mkpu ike. O nweghị onye ga-anụ olu okwu ya nʼezi. Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi azọpịara nʼala, maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị, tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi merie. Ọ bụkwa nʼaha ya ka mba niile dị nʼụwa ga-atụkwasị olileanya ha.” Emesịa, ha kpọtaara ya otu nwoke kpuru ìsì ma daakwa ogbi. Ọ bụkwa onye mmụọ ọjọọ na-esogbu. Ọ gwọrọ ya, mee ka nwoke ahụ hụ ụzọ, bidokwa ikwu okwu. Ihe a juru igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ anya. Nʼihi ya, ha kwuru sị, “Nwoke a, ọ ga-abụ Nwa Devid?”

MATIU 12:1-23 Bible Nso (IGBOB)

N'oge ahu Jisus gara n'etiti ubi ọka n'ubọchi-izu-ike; ma agu nāgu ndi nēso uzọ-Ya, ha we malite ighọ oko ọka, na ita ya. Ma ndi-Farisi, mb͕e ha huru ya, ha si Ya, Le, ndi nēso uzọ-Gi nēme ihe nēzighi ezi n'iwu ime n'ubọchi-izu-ike. Ma Ọ siri ha, Ùnu agughi ihe Devid mere, mb͕e agu guru ya, na ndi soro ya; otú ọ batara n'ulo Chineke, rie ob͕e achicha anēche n'iru Chineke, nke nēzighi ezi n'iwu ka o rie, ma-ọbu ndi so ya, kama ọ bu nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi? Ma-ọbu ùnu agughi n'iwu, na ndi-nchu-àjà nēmeru ubọchi-izu-ike n'ulo uku Chineke n'ubọchi-izu-ike, ma adighi-ata ha uta? Ma asim unu, na Onye di uku kari ulo Chineke nọ n'ebe a. Ma ọ buru na unu marari ihe okwu a bu, Anamachọ ebere, ọ bughi àjà, unu agaghi-ekpeb͕u ndi adighi-ata ha uta. N'ihi na Nwa nke madu bu Onye-nwe ubọchi-izu-ike. O we si n'ebe ahu pua, ba n'ulo-nzukọ-ha: ma le, otù nwoke nke nwere aka kpọnwuru akpọnwu. Ha we jua Ya, si, Ò ziri ezi n'iwu ime ka aru madu di ike n'ubọchi-izu-ike? ka ha we bo Ya ebubo. ma Ọ siri ha, Òle madu gādi n'etiti unu, nke gēnwe otù aturu, ma ọ buru na aturu ahu adabà nime olùlù n'ubọchi-izu-ike, ọ̀ gaghi-ejide ya, dọgoputa ya? Òle kwa ka ọ ra, bú otú ọnu-ahia madu kariri nke aturu oké ọnu! Ya mere o ziri ezi n'iwu ime ihe ọma n'ubọchi-izu-ike. Mb͕e ahu Ọ si nwoke ahu, Setipu aka-gi. O we setipu ya; ewe me ka aka-ya di nma, dika nke-ọzọ. Ndi-Farisi we pua, b͕a izù imegide Ya, ka ha gēsi la Ya n'iyì. Ma ebe Jisus mara ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya: ọtutu madu we so Ya; O we me ka aru di ha nile ike, O we dọ ha aka na nti ka ha ghara ime ka Ọ puta ìhè: ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si, Le, Onye nējerem ozi Onye M'rọputara; Onye M'huru n'anya, Onye ihe-Ya di nkpuru-obim ezi nma: M'gātukwasi Ya Mọ nkem, Ọ gākọ-kwa-ra mba nile akukọ ikpé. Ọ gaghi-alu ọ̀gù, Ọ gaghi-etisi kwa nkpu ike; Ọ dighi kwa onye ọ bula gānu olu-Ya n'amá. Ọ gaghi-akpaji ami apiara apia, Ọ gaghi-emenyu kwa ogho-oriọna nākwu anwuru-ọku, Rue mb͕e Ọ gātupu ikpé-Ya rue na nmeri. Ọ bu kwa n'aha-Ya ka mba nile gātukwasi obi. Mb͕e ahu ekutara Ya otù onye mọ ọjọ ji, bú onye kpuru ìsì nke da-kwa-ra ob͕i: O we me ka aru-ya di ike, ya mere onye-ob͕i ahu kwuru okwu hu kwa uzọ. Ibobo we nwua ìgwè madu ahu nile n'aru, ha we si, Nwoke a, Ọ̀ gābu nwa Devid?