Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 23:32-49

LUK 23:32-49 IGBOB

Ma ndikom abua ọzọ, ndi nālu ọlu ọjọ, ka edukwara, Ya na ha, ka eb͕ue ha. Ma mb͕e ha biara n'ebe anākpọ Okpokoro-isi, n'ebe ahu ka ha kpọgidere Ya na ndi ahu nālu ọlu ọjọ n'obe, otù onye n'aka-nri-Ya na onye ọzọ n'aka-ekpe-Ya. Ma Jisus siri, Nna, b͕aghara ha; n'ihi na ha amataghi ihi ha nēme. Mb͕e ha nēkè kwa uwe-Ya n'etiti onwe-ha ha fere nzà. Ndi-Ju nēguzo kwa, nēkiri. Ndi-isi we me kwa Ya ihe-ọchì, si, Ọ zọputara ndi ọzọ; Ya zọputa Onwe-ya, ọ buru na Onye a bu Kraist nke Chineke, Onye Ọ rọputara. Ndi-agha we me kwa Ya ihe-ọchì, nābiakute Ya, nēche kwa n'iru Ya manya-vine b͕ara uka, si, Ọ buru na Gi onwe-gi bu Eze ndi-Ju, zọputa Onwe-gi. Ma ihe-ndekwasi di kwa n'elu isi-Ya, ONYE A BU EZE NDI-JU. Otù nime ndi ahu nālu ọlu ọjọ ndi akwubara nēkwulu kwa Ya, si, Gì onwe-gi abughi Kraist ahu? zọputa Onwe-gi na ayi. Ma ibe-ya zara, we bara ya mba, si, Gì onwe-gi adighi-atu egwu ọbuná Chineke, ebe i nọ n'ọmuma-ikpé ahu? N'ezi-okwu amakwara ayi ikpé ziri ezi; n'ihi na ayi nānata ihe kwesiri ihe ayi mere: ma ọ dighi ihe ọ bula Onye a mehiere. O we si, Jisus, chetam mb͕e ọ bula I gābia n'ala-eze-Gi. Ọ we si ya, N'ezie asim i, Ta ka Mu na gi gānọ na Paradais. Ma ub͕u a ọ di ka oge hour nke-isi, ọchichiri we b͕a n'ala ahu dum rue oge hour nke-iteghete, n'ihi na anyanwu nāb͕a itiri: ákwà-nb͕ochi nke ulo nsọ Chineke we b͕awa n'etiti. Mb͕e Jisus tisiri nkpu n'oké olu, Ọ si, Nna, n'aka-Gi ka M'nēnye mọm idebe: mb͕e O kwusiri nka, O we kubìe ume. Ma mb͕e ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise huru ihe mere, o tobe Chineke, si, N'ezi-okwu Nwoke a bu onye ezi omume. Ìgwè madu nile ndi zukọrọ n'ihe-nkiri a, mb͕e ha kirisiri ihe nile mere, ha we laghachi nēti aka n'obi-ha. Ndi nile ndi mara Ya nke-ọma, na ndinyom ndi soro Ya site na Galili, guzokwara n'ebe di anya, nēle ihe ndia.

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara