Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 23:32-49

LUK 23:32-49 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ha dukwaara mmadụ abụọ bụ ndị ohi gaa igbu ha na ya. Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi, ebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe ya na ndị ohi abụọ ahụ. Otu nʼaka nri ya nke ọzọ nʼaka ekpe ya. Jisọs sịrị, “Nna gbaghara ha nʼihi na ha amataghị ihe ha na-eme.” Ha ji ife nza kee uwe ya nʼetiti onwe ha. Ndị mmadụ guzoro ebe ahụ na-ele anya, ka ndị ọchịchị ji ya na-eme ihe ọchị, na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ya zọpụtanụ onwe ya, ma ọ bụrụ na ọ bụ Kraịst nke Chineke, bụ Onye a họpụtara.” Ndị agha bịakwara chịa ya ọchị. Ha nyere ya mmanya gbara ụka, ma na-asị, “Ọ bụrụ na ị bụ eze ndị Juu, zọpụtanụ onwe gị.” Ihe e dere nʼelu isi obe ahụ bụ: Onye a bụ Eze ndị Juu. Otu onye nʼime ndị ohi ahụ a kpọgidekwara nʼobe nʼebe ahụ kparịkwara ya sị, “Ọ bụghị gị bụ Kraịst? Zọpụtanụ onwe gị ma zọpụtakwa anyị.” Ma onye nke ọzọ a makwara ikpe ọnwụ baara ya mba sị, “Ị naghị atụ Chineke egwu, ị hụghị na a mara gị ikpe dị ka e si maa ya. Anyị na-ata ahụhụ kwesiri anyị, nʼihi na a na-ata anyị ahụhụ nʼihi ihe anyị mere, ma nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọbụla.” Mgbe ahụ ọ sịrị, “Jisọs, chetakwa m mgbe ị bara nʼalaeze gị.” Ọ sịrị ya, “Nʼezie a agwa m gị, taa, ị ga-anọnyere m na paradaịs.” Mgbe ọ na-eru ihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile ruo elekere atọ nke ehihie. Nʼihi na anyanwụ kwụsịrị inye ihe ya. Akwa mgbochi dị nʼụlọnsọ ukwu sitere nʼelu gbawaa abụọ. Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, “Nna, nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m.” Mgbe o kwusiri nke a, o kubiri ume. Mgbe ọchịagha na-achị otu narị ndị agha hụrụ ihe merenụ, o nyere Chineke otuto ma kwuokwa sị, “Nʼezie nwoke a bụ onye ezi omume.” Mgbe igwe mmadụ niile gbakọtara ilere anya hụrụ ihe mere, ha laghachiri nʼụlọ ha na-eti aka nʼobi. Ma ndị niile maara onye ọ bụ, tinyekwara ụmụ nwanyị ndị soro ya si Galili bịa, guzokwara nʼebe dị anya na-ele ihe ndị a.

LUK 23:32-49 Bible Nso (IGBOB)

Ma ndikom abua ọzọ, ndi nālu ọlu ọjọ, ka edukwara, Ya na ha, ka eb͕ue ha. Ma mb͕e ha biara n'ebe anākpọ Okpokoro-isi, n'ebe ahu ka ha kpọgidere Ya na ndi ahu nālu ọlu ọjọ n'obe, otù onye n'aka-nri-Ya na onye ọzọ n'aka-ekpe-Ya. Ma Jisus siri, Nna, b͕aghara ha; n'ihi na ha amataghi ihi ha nēme. Mb͕e ha nēkè kwa uwe-Ya n'etiti onwe-ha ha fere nzà. Ndi-Ju nēguzo kwa, nēkiri. Ndi-isi we me kwa Ya ihe-ọchì, si, Ọ zọputara ndi ọzọ; Ya zọputa Onwe-ya, ọ buru na Onye a bu Kraist nke Chineke, Onye Ọ rọputara. Ndi-agha we me kwa Ya ihe-ọchì, nābiakute Ya, nēche kwa n'iru Ya manya-vine b͕ara uka, si, Ọ buru na Gi onwe-gi bu Eze ndi-Ju, zọputa Onwe-gi. Ma ihe-ndekwasi di kwa n'elu isi-Ya, ONYE A BU EZE NDI-JU. Otù nime ndi ahu nālu ọlu ọjọ ndi akwubara nēkwulu kwa Ya, si, Gì onwe-gi abughi Kraist ahu? zọputa Onwe-gi na ayi. Ma ibe-ya zara, we bara ya mba, si, Gì onwe-gi adighi-atu egwu ọbuná Chineke, ebe i nọ n'ọmuma-ikpé ahu? N'ezi-okwu amakwara ayi ikpé ziri ezi; n'ihi na ayi nānata ihe kwesiri ihe ayi mere: ma ọ dighi ihe ọ bula Onye a mehiere. O we si, Jisus, chetam mb͕e ọ bula I gābia n'ala-eze-Gi. Ọ we si ya, N'ezie asim i, Ta ka Mu na gi gānọ na Paradais. Ma ub͕u a ọ di ka oge hour nke-isi, ọchichiri we b͕a n'ala ahu dum rue oge hour nke-iteghete, n'ihi na anyanwu nāb͕a itiri: ákwà-nb͕ochi nke ulo nsọ Chineke we b͕awa n'etiti. Mb͕e Jisus tisiri nkpu n'oké olu, Ọ si, Nna, n'aka-Gi ka M'nēnye mọm idebe: mb͕e O kwusiri nka, O we kubìe ume. Ma mb͕e ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise huru ihe mere, o tobe Chineke, si, N'ezi-okwu Nwoke a bu onye ezi omume. Ìgwè madu nile ndi zukọrọ n'ihe-nkiri a, mb͕e ha kirisiri ihe nile mere, ha we laghachi nēti aka n'obi-ha. Ndi nile ndi mara Ya nke-ọma, na ndinyom ndi soro Ya site na Galili, guzokwara n'ebe di anya, nēle ihe ndia.

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara