O we si ndi nēso uzọ-Ya, Ọ bu ihe nāghaghi ime na ihe di ìche iche nēme ka madu ma n'ọnyà gābia: ma ahuhu gādiri onye ahu, nke ha nēsite n'aka-ya bia. Ọ gakara ya-ri mma ma akwuba ya nkume-igwe-nri n'olu, tubà kwa ya n'oké osimiri, kari na ọ gēme ka otù onye nime ndi ntà ndia ma n'ọnyà. Nēzenu onwe-unu: ọ buru na nwa-nna-gi emehie, bara ya nba; ọ buru kwa na ọ chègharia, b͕aghara ya. Ọ buru kwa na o mehiere megide gi ub͕ò asa n'otù ubọchi, we chigharia ọzọ n'ebe i nọ ub͕ò asa, si, Echègharim; i gāb͕aghara ya.
Ndi-ozi-Ya we si Onye-nwe-ayi, Tukwasiri ayi okwukwe. Onye-nwe-ayi we si, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi osisi sycamine nka, Ka eropu gi, ku kwa gi n'oké osimiri; ọ gāṅa kwa unu nti. Ma ònye n'etiti unu, asi na o nwere orù nke nālu ọlu ubi ma-ọbu nke nāzù aturu, gāsi ya, mb͕e o si n'ubi bata n'ulo, Bia ngwa ngwa nọdu na nri; nke nāgaghi-asi kwa ya kama nke ahu, Dozie ihe m'gēri na nri-anyasi, ke kwa ihe-ọkiké n'úkwù-gi, nējerem ozi, rue mb͕e m'risiri ṅu kwa; ma emesia gi onwe-gi gēri ṅu kwa? Ọ̀ nwere ekele n'ebe orù ahu nọ n'ihi na ọ mere ihe akaworo àkà? Otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gēmesi ihe nile akaworo àkà nye unu, sinu, Ayi bu orù ndi nābaghi n'ihe; ayi emewo ihe ayi ji ugwọ ime.
O rue, mb͕e ha nāga Jerusalem, na Ya onwe-ya nāgabiga n'etiti Sameria na Galili. Mb͕e Ọ nābà n'otù obodo ntà, ndikom iri, bú ndi-ekpenta, we zute Ya, ndi guzoro n'ebe di anya: ha we welie olu-ha elu, si, Jisus, Nna-ayi, mere ayi ebere. Mb͕e Ọ huru ha, O we si ha, Ganu, were onwe-unu gosi ndi-nchu-àjà. O we rue, mb͕e ha nāga, na emere ka aru-ha di ọcha. Ma otù onye n'etiti ha, mb͕e ọ huru na emere ka aru di ya ike, ọ laghachi, were oké olu nenye Chineke otuto; o we da kpuchie iru-ya n'ala n'ukwu-Ya, nēkele Ya: onye ahu bu kwa onye Sameria. Ma Jisus zara, si, Èmeghi ka aru ndikom iri ahu di ọcha? ma òle ebe iteghete fọduru no? Àhughi ndi laghachiri inye Chineke otuto, ma-ọbughi onye ala ọzọ a? O we si ya, Bilie, ga nke gi: okwukwe-gi azọputawo gi.