LUK 17:1-19
LUK 17:1-19 Bible Nso (IGBOB)
O we si ndi nēso uzọ-Ya, Ọ bu ihe nāghaghi ime na ihe di ìche iche nēme ka madu ma n'ọnyà gābia: ma ahuhu gādiri onye ahu, nke ha nēsite n'aka-ya bia. Ọ gakara ya-ri mma ma akwuba ya nkume-igwe-nri n'olu, tubà kwa ya n'oké osimiri, kari na ọ gēme ka otù onye nime ndi ntà ndia ma n'ọnyà. Nēzenu onwe-unu: ọ buru na nwa-nna-gi emehie, bara ya nba; ọ buru kwa na ọ chègharia, b͕aghara ya. Ọ buru kwa na o mehiere megide gi ub͕ò asa n'otù ubọchi, we chigharia ọzọ n'ebe i nọ ub͕ò asa, si, Echègharim; i gāb͕aghara ya. Ndi-ozi-Ya we si Onye-nwe-ayi, Tukwasiri ayi okwukwe. Onye-nwe-ayi we si, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi osisi sycamine nka, Ka eropu gi, ku kwa gi n'oké osimiri; ọ gāṅa kwa unu nti. Ma ònye n'etiti unu, asi na o nwere orù nke nālu ọlu ubi ma-ọbu nke nāzù aturu, gāsi ya, mb͕e o si n'ubi bata n'ulo, Bia ngwa ngwa nọdu na nri; nke nāgaghi-asi kwa ya kama nke ahu, Dozie ihe m'gēri na nri-anyasi, ke kwa ihe-ọkiké n'úkwù-gi, nējerem ozi, rue mb͕e m'risiri ṅu kwa; ma emesia gi onwe-gi gēri ṅu kwa? Ọ̀ nwere ekele n'ebe orù ahu nọ n'ihi na ọ mere ihe akaworo àkà? Otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gēmesi ihe nile akaworo àkà nye unu, sinu, Ayi bu orù ndi nābaghi n'ihe; ayi emewo ihe ayi ji ugwọ ime. O rue, mb͕e ha nāga Jerusalem, na Ya onwe-ya nāgabiga n'etiti Sameria na Galili. Mb͕e Ọ nābà n'otù obodo ntà, ndikom iri, bú ndi-ekpenta, we zute Ya, ndi guzoro n'ebe di anya: ha we welie olu-ha elu, si, Jisus, Nna-ayi, mere ayi ebere. Mb͕e Ọ huru ha, O we si ha, Ganu, were onwe-unu gosi ndi-nchu-àjà. O we rue, mb͕e ha nāga, na emere ka aru-ha di ọcha. Ma otù onye n'etiti ha, mb͕e ọ huru na emere ka aru di ya ike, ọ laghachi, were oké olu nenye Chineke otuto; o we da kpuchie iru-ya n'ala n'ukwu-Ya, nēkele Ya: onye ahu bu kwa onye Sameria. Ma Jisus zara, si, Èmeghi ka aru ndikom iri ahu di ọcha? ma òle ebe iteghete fọduru no? Àhughi ndi laghachiri inye Chineke otuto, ma-ọbughi onye ala ọzọ a? O we si ya, Bilie, ga nke gi: okwukwe-gi azọputawo gi.
LUK 17:1-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Ihe ndị nke na-eme ka mmadụ jehie aghaghị ịdị, ma ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla ọnọdụ ndị a ga-esi nʼaka ya bịa. Ọ ga-akara gị mma ka e kenye gị nkume igwe nri nʼolu, tụnye gị nʼime oke osimiri, karịa na ị ga-eduhie otu nʼime ụmụntakịrị ndị a ụzọ. Kpachapụrụnụ onwe unu anya! “Ọ bụrụ na nwanna gị e mejọọ gị, baara ya mba. Ọ bụrụ na o chegharịa, gbaghara ya. Ọ bụrụkwa na o mejọọ gị ugboro asaa nʼotu ụbọchị, rịọkwa gị ugboro asaa sị, ‘E chegharịala m,’ ị ghaghị ịgbaghara ya.” Ndị ozi ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, mee ka okwukwe anyị dị ukwuu!” Onyenwe anyị zara, “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke ha ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị osisi ukwu a, Ka e site na mgbọrọgwụ hopu gị ma kụọkwa gị nʼime oke osimiri, ọ ga-erubere unu isi. “Ọ bụ onye nʼime unu nke nwere ohu onye si ebe ọ gara rụọ ọrụ maọbụ ịzụ atụrụ lọbata, ga-asị ya, ‘Mee ngwangwa nọdụ ala rie nri’? Ọ gaghị asị ya, ‘Siere m nri ọsịịsọ, kwadoo onwe gị jere m ozi ka m na-eri na aṅụkwa ihe ọṅụṅụ; emesịa ị ga-eri nri ma ṅụọ ihe ọṅụṅụ nke gị’? Ọ ga-ekele ohu ahụ nʼihi na ọ rụrụ ọrụ o kwesiri ịrụ? Nʼotu aka ahụ, mgbe unu rụchara ọrụ niile unu kwesiri ịrụ, ihe unu ga-ekwu bụ, ‘Anyị bụ ụmụ ohu na-ekwesighị ekwesi, anyị emeela ihe anyị kwesiri ime.’ ” Ka ọ na-aga Jerusalem, o sitere nʼụzọ dị nʼagbata Sameria na Galili. Mgbe ọ banyere nʼotu obodo nta, ndị ekpenta iri sitere nʼebe dị anya zute ya. Ha tiri mkpu nʼoke olu sị, “Jisọs nna anyị ukwuu, mere anyị ebere.” Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha, “Gaanụ gosi ndị nchụaja onwe unu.” Dị ka ha na-aga, e mere ka ha dị ọcha. Mgbe otu nʼime ha chọpụtara na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chineke. Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, kelee ya. Ọ bụ onye Sameria. Jisọs jụrụ sị, “Ọ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha, ebeekwanụ ka itoolu ndị ọzọ nọ? Ọ bu naanị onye mba ọzọ a lọghachiri inye Chineke otuto?” Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Bilie, laa, okwukwe gị agwọọla gị.”