Ọzọ, mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye, aka-ya ewe ghara idi ike n'ebe-obibi-gi; i gēye-kwa-ra ya aka: dika ọbìa na onye-nnọdu ka ọ gābu, o gēbiyere kwa gi. Anarala ya uma ma-ọbu ọmuru-nwa; ma tua egwu Chineke-gi: ka nwa-nne-gi we biyere gi. Enyela ya ego-gi n'uma, enye-kwa-la ya ihe-oriri-gi n'ọmuru-nwa. Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt puta, inye unu ala Kenean, iburu unu Chineke. Ọzọ, mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye n'ebe-obibi-gi, we renye gi onwe-ya; emela ka ọ fè òfùfè nke orù: dika onye egoro ọlu, dika onye-nnọdu, ka ọ gānọ n'aka-gi; rue arọ jubile ka ọ gēfè òfùfè n'aka-gi: o gēsi kwa n'aka-gi pua, ya onwe-ya na umu-ya tiyere ya, ọ gālaghachikuru kwa ab͕uru-ya, ihe-onwunwe nke nna-ya-hà ka ọ gālaghachikuru kwa. N'ihi na ndi-orùm ka ha bu, ndi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta: agaghi-ere ha dika anēre orù. Ewela nkpab͕u zọda ya; ma tua egwu Chineke-gi. Ma orù-gi ndikom na orù-gi ndinyom, ndi i gēnwe; site n'aka mba nile nke di unu buruburu, site n'aka-ha ka unu gāb͕ata orù-ndikom na orù-ndinyom. Ọzọ kwa, ufọdu nime umu ndi-nnọdu ndi nọ dika ọbìa n'ala-unu, ufọdu nime ha ka unu gāb͕ata, na ufọdu nime ab͕uru-ha ndi nọ n'ala-unu ndi ha muru n'ala-unu: ha gābu-kwa-ra unu ihe-onwunwe. Unu gēme ha ka ha buru ihe-nketa umu-unu ndi gānochi unu gēnwe, inweta dika-onwunwe; rue mb͕e ebighi-ebi ufọdu nime ndi ahu ka unu gēme ka ha buru orú-unu: ma unu ewela nkpab͕u zọda umu-nne-unu, bú umu Israel, nāzọdarita onwe-unu n'otù n'otù.
Gụọ LEVITIKỌS 25
Geere nke a ntị LEVITIKỌS 25
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LEVITIKỌS 25:35-46
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị