Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LEVITIKỌS 25:35-46

LEVITIKỌS 25:35-46 Bible Nso (IGBOB)

Ọzọ, mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye, aka-ya ewe ghara idi ike n'ebe-obibi-gi; i gēye-kwa-ra ya aka: dika ọbìa na onye-nnọdu ka ọ gābu, o gēbiyere kwa gi. Anarala ya uma ma-ọbu ọmuru-nwa; ma tua egwu Chineke-gi: ka nwa-nne-gi we biyere gi. Enyela ya ego-gi n'uma, enye-kwa-la ya ihe-oriri-gi n'ọmuru-nwa. Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt puta, inye unu ala Kenean, iburu unu Chineke. Ọzọ, mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye n'ebe-obibi-gi, we renye gi onwe-ya; emela ka ọ fè òfùfè nke orù: dika onye egoro ọlu, dika onye-nnọdu, ka ọ gānọ n'aka-gi; rue arọ jubile ka ọ gēfè òfùfè n'aka-gi: o gēsi kwa n'aka-gi pua, ya onwe-ya na umu-ya tiyere ya, ọ gālaghachikuru kwa ab͕uru-ya, ihe-onwunwe nke nna-ya-hà ka ọ gālaghachikuru kwa. N'ihi na ndi-orùm ka ha bu, ndi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta: agaghi-ere ha dika anēre orù. Ewela nkpab͕u zọda ya; ma tua egwu Chineke-gi. Ma orù-gi ndikom na orù-gi ndinyom, ndi i gēnwe; site n'aka mba nile nke di unu buruburu, site n'aka-ha ka unu gāb͕ata orù-ndikom na orù-ndinyom. Ọzọ kwa, ufọdu nime umu ndi-nnọdu ndi nọ dika ọbìa n'ala-unu, ufọdu nime ha ka unu gāb͕ata, na ufọdu nime ab͕uru-ha ndi nọ n'ala-unu ndi ha muru n'ala-unu: ha gābu-kwa-ra unu ihe-onwunwe. Unu gēme ha ka ha buru ihe-nketa umu-unu ndi gānochi unu gēnwe, inweta dika-onwunwe; rue mb͕e ebighi-ebi ufọdu nime ndi ahu ka unu gēme ka ha buru orú-unu: ma unu ewela nkpab͕u zọda umu-nne-unu, bú umu Israel, nāzọdarita onwe-unu n'otù n'otù.

LEVITIKỌS 25:35-46 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

“ ‘Ọ bụrụ na nwanne gị adaa ogbenye ruo na o nweghị ike inyere onwe ya aka, ọ dị gị nʼaka inyere ya aka, kpọbata ya ka ọ bịa biri nʼụlọ gị dịka ị ga-esi kpọbata onye ọbịa. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-anọgide biri nʼetiti unu. Tụọ egwu Chineke, kwerekwa ka nwanna gị soro gị biri nʼala ahụ. A nakwala ụma maọbụ ọmụrụnwa ọbụla. Ị gaghị ana ọmụrụnwa nʼego i gbazinyere ha, maọbụ rie uru site na nri i resiri ha. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, inye unu ala Kenan, na ị bụ Chineke unu. “ ‘Ọ bụrụ na onye Izrel ọbụla adaa ogbenye, resi gị onwe ya, emela ka o jere gị ozi dịka onye ohu. Kama ị ga-emeso ya mmeso dịka ị ga-esi meso onye ọrụ e goro ego, maọbụ dịka onye ọbịa nọ nʼetiti unu. Ọ ga-ejere gị ozi tutu ruo afọ inwere onwe. Nʼafọ ahụ, ị ga-ahapụ ha na ụmụ ha ka ha laghachikwuru ndị ikwu ha, si otu a nwetaghachi ala ubi dị nʼezinaụlọ ha. Nʼihi na a kpọpụtara m ndị Izrel site nʼala Ijipt ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi. Ya mere, a gaghị ere ha mgbe ọbụla dịka ohu. A gakwaghị emegbu ha nʼụzọ dị njọ. Tụọnụ egwu Chineke unu. “ ‘Ma unu nwere ike gbara ndị ohu nwoke maọbụ nwanyị site nʼetiti ndị mba ọzọ niile bi nʼakụkụ unu. Unu nwere ike site nʼebe ahụ zụta ndị ohu. Unu nwere ike ịzụ ndị ohu site nʼetiti ndị mbịarambịa bi nʼetiti unu, maọbụ site nʼetiti ndị agbụrụ ha a mụrụ nʼala Izrel. Ndị dị otu a ga-abụkwa ihe onwunwe unu. Unu nwere ike kenye ha ụmụ unu dịka ihe nketa, ma mee ha ndị ohu unu ụbọchị ndụ ha niile. Ma unu agaghị eji aka ike chịa onye Izrel ibe unu.