Jehova we gwa Moses okwu, si, Nye umu Israel iwu, ka ha wetara gi manu olive anāgwaghi agwa nke asuru asu, itiye n'ihe nēnye ìhè, iweli oriọna mb͕e dum. N'èzí ákwà-nb͕ochi nke ihe-àmà, n'ulo-ikwū nzute, ka Eron gēdo ya n'usoro site n'anyasi rue ututu n'iru Jehova mb͕e dum: ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile. N'elu ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo anāgwaghi agwa ka ọ gēdo oriọna nile n'usoro n'iru Jehova mb͕e dum. Ọzọ, i gēwere utu ọka flour, sie ya ka ọ buru ob͕e achicha iri na abua: uzọ abua n'uzọ iri nke ephah gādiri otù ob͕e achicha. I gēdo kwa ha n'usoro abua, isi n'otù usoro, n'elu table nke ọla-edo anāgwaghi agwa n'iru Jehova. I gētiye kwa frankincense anāgwaghi agwa n'elu usoro ọ bula, ka ọ we ghọrọ achicha ahu ihe-ncheta, bú àjà-ọku anāchuru Jehova. Kwa-ubọchi-izu-ike o gēdo ya n'usoro n'iru Jehova mb͕e dum; o sitere n'umu Israel, ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka ọ bu. Ọ gādiri Eron na umu-ya ndikom; ha gēri ya n'ebe di nsọ n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ buru ya sitere n'àjà-ọku nile nke Jehova, ọ bu ukpuru ebighi-ebi.
Gụọ LEVITIKỌS 24
Geere nke a ntị LEVITIKỌS 24
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LEVITIKỌS 24:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo