Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LEVITIKỌS 24:1-9

LEVITIKỌS 24:1-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

ONYENWE ANYị gwara Mosis sị, “Nye ndị Izrel niile iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv asụrụ asụ, nke a na-agwaghị ihe, maka itinye nʼiheọkụ ime ka ọkụ oriọna na-enwu mgbe niile. Na mpụta nke akwa mgbochi nke kpuchiri igbe Ihe Ama ahụ, nʼime ụlọ nzute, Erọn ga-amụnye oriọna ndị ahụ nʼihu ONYENWE ANYị mgbe niile, site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide nye ọgbọ niile dị nʼihu. Ihe ọkụ ọlaedo a nụchara anụcha ndị ahụ dọọ nʼelu ihe ịdọkwasị oriọna, nʼihu ONYENWE ANYị ga na-enwu ọkụ mgbe niile. ONYENWE ANYị “Were ọka a kwọrọ nke ọma mee ogbe achịcha iri na abụọ. Jiri ihe ruru iko ọka asatọ mee otu ogbe achịcha ọbụla. Doo achịcha ndị a nʼahịrị abụọ nʼelu tebul ahụ e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, nke dị nʼihu ONYENWE ANYị. Ogbe achịcha isii ga-adị nʼotu ahịrị. Nʼogologo ahịrị ọbụla tinye insensi a na-agwaghị ihe, ka ọ bụrụ ihe nọchiri achịcha ndị a dịka onyinye nsure ọkụ nye ONYENWE ANYị. A ga-edo achịcha ndị a nʼihu ONYENWE ANYị oge niile, ụbọchị izuike niile, nʼọnọdụ ụmụ Izrel, dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi. Ọ dịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom, bụ ndị ga-eri ya nʼime nʼebe nsọ ahụ, nʼihi na ọ bụ oke dịkarịsịrị nsọ, site nʼoke ha mgbe niile, nke sitere nʼonyinye nsure ọkụ e chere nye ONYENWE ANYị.”