Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LEVITIKỌS 23

23
1Jehova we gwa Moses okwu, si, 2Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e nile akara àkà nke Jehova, nke unu gākpọsa ha, ka ha buru nkpọkọta nsọ, ndia bu mb͕em akara àkà. 3Ubọchi isi ka agēje ozi: ma n'ubọchi nke-asa, ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike gādi, bú nkpọkọta nsọ: ọ dighi ozi ọ bula unu gēje: ubọchi-izu-ike nke Jehova nwere ka ọ bu n'ebe-obibi-unu nile.
4Ndia bu mb͕e akara àkà nke Jehova, bú nkpọkọta nsọ, nke unu gākpọsa na mb͕e-ha akara àkà. 5N'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'etiti ehihie na anyasi, ka ngabiga nke diri Jehova gādi. 6N'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa ahu ka ememe achicha ekoghi-eko gādi-kwa-ra Jehova: ubọchi asa ka unu gēri achicha ekoghi-eko. 7N'ubọchi mbu unu gēnwe nkpọkọta nsọ: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje. 8Ma unu gēweta nso àjà-ọku anāchuru Jehova ubọchi asa: n'ubọchi nke-asa nkpọkọta nsọ gādi; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.
9Jehova we gwa Moses okwu, si, 10Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu bara n'ala nke Mu onwem nēnye unu, mb͕e unu gēwe kwa ihe-ubi-ya, unu gēweta-kwa-ra onye-nchu-àjà ùkwù nke ihe mbu nke owuwu-ihe-ubi-unu: 11ọ gēfé kwa ùkwù ahu n'iru Jehova, ka unu we buru ihe nātọ utọ: n'echi nke ubọchi-izu-ike ahu ka onye-nchu-àjà gēfé ya. 12N'ubọchi unu nēfé ùkwù ahu, unu gēme nwa-ebulu nke zuru okè nke b͕ara otù arọ ka ọ buru àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova. 13Onyinye-inata-iru-ọma-ya gābu uzọ abua n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour agwara manu, bú àjà-ọku anāchuru Jehova ibu ísì utọ: àjà-ihe-ọṅuṅu-ya gābu kwa manya-vine, otù uzọ n'uzọ anọ nke hin. 14Unu eri-kwa-la achicha, ma-ọbu ọka aṅara aṅa, ma-ọbu ọka rara oko, rue otù ubọchi a, rue mb͕e unu wetara onyinye iji biaru nso nke Chineke-unu: ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n'ebe-obibi-unu nile.
15Unu gāgu-kwa-ra onwe-unu site n'echi nke ubọchi-izu-ike ahu, site n'ubọchi unu butere ùkwù nke àjà-ofufé; ubọchi-izu-ike asa zuru okè gādi: 16rue echi nke ubọchi-izu-ike nke-asa ka unu gāgu ọgu ubọchi abua na iri, unu gēweta kwa nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma ọhu. 17Unu gēsite n'ebe-obibi-unu weta ob͕e achicha abua nke àjà-ofufé, nke uzọ abua n'uzọ iri nke ephah: utu ọka flour ka ha gābu, ihe nēko achicha ka agēji si ha, iburu Jehova nkpuru mbu. 18Unu gēweta kwa nso umu-aturu asa ndi zuru okè nke b͕ara otù arọ, na otù nwa-oke-ehi, na ebulu abua, tiyere achicha ahu: ha gābu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova, ha na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ha, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova. 19Unu gēme kwa otù nkpi ka ọ buru àjà-nmehie, me kwa umu-ebulu abua nke b͕ara otù arọ ka ha buru ihe àjà nke àjà-udo. 20Onye-nchu-àjà gēfé kwa ha tiyere achicha nke nkpuru mbu ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova tiyere umu-aturu abua ahu: nsọ ka ha gādiri Jehova n'ebe onye-nchu-àjà nọ. 21Unu gākpọsa kwa òkù n'otù ubọchi ahu; nkpọkọta nsọ gādiri unu: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: ukpuru ebighi-ebi ka ọ bu n'ebe-obibi-unu nile rue ọbọ-unu nile.
22Mb͕e unu nēwe ihe-ubi nke ala-unu ewesila ihe di n'akuku ubi-gi mb͕e i nēwe ihe-ubi-gi, achikọta-kwa-la ihe-nchikọta nke owuwe-ihe-ubi-gi fọduru: ob͕eye na ọbìa ka i gārapuru ha: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
23Jehova we gwa Moses okwu, si, 24Gwa umu Israel okwu, si, N'ọnwa nke-asa, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, idebe-ubọchi-izu-ike gādiri unu, ncheta nke uda-opì nādasi ike, nkpọkọta nsọ. 25Ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova.
26Jehova we gwa Moses okwu, si, 27Otú ọ di, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa nke-asa nka ka ubọchi nkpuchi-nmehie gādi: nkpọkọta nsọ ka ọ gāburu unu, unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n'ala; unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova. 28Ọ dighi kwa ozi ọ bula unu gēje n'otu ubọchi ahu: n'ihi na ubọchi nkpuchi-nmehie ka ọ bu, ikpuchiri unu nmehie-unu n'iru Jehova, bú Chineke-unu. 29N'ihi na madu ọ bula nke anewedaghi n'ala n'otù ubọchi ahu, agēbipu ya n'etiti umu-nna-ya. 30Ma madu ọ bula nke nēje ozi ọ bula n'otù ubọchi ahu, M'gēme ka madu ahu si n'etiti ndi-ya la n'iyì. 31Ọ dighi ozi ọ bula unu gēje: ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n'ebe-obibi-unu nile. 32Ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike ka ọ gāburu unu, unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n'ala: n'ubọchi nke-iteghete nke ọnwa n'anyasi, site n'anyasi rue anyasi, ka unu gēdebe ubọchi-izu-ike-unu.
33Jehova we gwa Moses okwu, si, 34Gwa umu Israel okwu, si, N'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-asa nka ka ememe ulo-ntu gādiri Jehova ubọchi asa. 35N'ubọchi mbu nkpọkọta nsọ gādi: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje. 36Ubọchi asa unu gēweta nso àjà-ọku ichuru Jehova: n'ubọchi nke-asatọ nkpọkọta nsọ gādiri unu; unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova: ubọchi nb͕ochi ka ọ bu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.
37Ndia bu mb͕e akara àkà nke Jehova, nke unu gākpọsa, ka ha buru nkpọkọta nsọ, iweta nso àjà-ọku anāchuru Jehova, bú àjà-nsure-ọku, na onyinye-inata-iru-ọma, àjà-ihe-ọṅuṅu, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya: 38nāgughi ubọchi-izu-ike nile nke Jehova, nāgughi kwa onyinye nile unu, nāgughi kwa nkwa-unu nile, nāgughi kwa onyinye-afọ-ofufo-unu nile, nke unu nēnye Jehova.
39Otú ọ di, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-asa ahu, mb͕e unu chikọtasiri ihe-ọmume nke ala ahu, unu gēme ememe Jehova ubọchi asa: n'ubọchi mbu idebe-ubọchi-izu-ike gādi, n'ubọchi nke-asatọ idebe-ubọchi-izu-ike gādi kwa. 40Unu gāchiri kwa n'onwe-unu n'ubọchi mbu nkpuru nke osisi ọma, na igu nkwu, na alaka osisi b͕ara ọhia, na osisi willow nke miri-iyi; unu gaṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, ubọchi asa. 41Unu gēme kwa ya dika ememe emere Jehova ubọchi asa n'arọ: ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile: n'ọnwa nke-asa ka unu gēme ya. 42N'ulo-ntu ka unu gēbi ubọchi asa; ndi nile amuru n'ala n'Israel gēbi n'ulo-ntu: 43ka ọb͕ọ-unu nile we mara na ọ bu n'ulo-ntu ka M'mere umu Israel ka ha biri, mb͕e M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 44Moses we gwa umu Israel mb͕e nile akara àkà nke Jehova.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

LEVITIKỌS 23: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye