Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ-ÁKWÁ 5

5
1Jehova, cheta ihe ruworo ayi aru:
Legide anya, hu ita-uta-ayi.
2Ihe-nketa-ayi ab͕anwewo ihe ndi ala ọzọ,
Ulo nile ab͕anwewo ihe ndi mba ọzọ.
3Umu-nb͕ei ka ayi ghọworo, bú ndi nēnweghi nna,
Nne-ayi-hà di ka ndinyom di-ha nwuru.
4Miri-ayi ka ayi jiworo ego ṅua;
Nkú-ayi nābiara ayi n'ọnu-ahia.
5Ọ bu inọkwasi n'olu-ayi ka achuworo ayi:
Ayi adọb͕uwo onwe-ayi n'ọlu, ma ekweghi ka ayi zuru ike.
6Ijipt ka ayi kweyeworo ekweye,
Ya na Asiria, ka nri we ju ayi afọ.
7Nna-ayi-hà emehiewo, ha adighi kwa ndu;
Ayi onwe-ayi eburuwo ajọ omume nile ha.
8Ndi-orù achiwo ayi:
Ọ dighi onye nānaputa ayi n'aka-ha.
9Ayi ji ndu-ayi n'aka weta nri-ayi
N'ihi mma-agha nke ọzara.
10Akpukpọ-aru-ayi di ọku dika ite-ọku uku
Site n'ifufe di ọku nke oké ugwu.
11Ndinyom nke di na Zaion ka ha wedara n'ala,
Ha na umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke n'obodo nile nke Juda.
12Ekobere ndi-isi n'aka-ha:
Asọpughi iru ndi-okenye.
13Umu-okorọbia buru nkume-igwe-nri,
Umu-okoro su-kwa-ra ngọngọ n'okpuru nkú.
14Ndi-okenye akwusiwo inọ n'ọnu-uzọ-ama,
Umu-okorọbia akwusiwo ikpọ ubọ-akwara-ha.
15Obi-utọ nke obi-ayi akwusiwo;
Otite-egwú-ayi ab͕anwewo n'ib͕a-nkpe.
16Okpu-eze nke isi-ayi adawo n'ala:
Ahuhu nādiri ayi nọ̄! n'ihi na ayi emehiewo.
17N'ihi nka ka aru nādighi obi-ayi nma;
N'ihi ihe ndia ka anya-ayi b͕aworo ọchichiri.
18N'ihi ugwu Zaion, nke tọb͕ọrọ n'efu;
Nkita-ọhia ejeghariwo na ya.
19Gi onwe-gi, Jehova, ọ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I nānọdu dika eze;
Oche-eze-Gi nādiru ọb͕ọ nile.
20N'ìhi gini ka I nēchezọ ayi rue mb͕e ebighi-ebi?
N'ìhi gini ka I nārapu ayi rue ogologo ubọchi nile?
21Me ka ayi laghachikute Gi, Jehova, ayi gālata kwa;
Me ka ubọchi nile ayi di ọhu dika na mb͕e ochie.
22Ma-ọbughi na I jusiwo ayi,
Wesa ayi iwe nke-uku.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ-ÁKWÁ 5: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye