Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOSHUA 16

16
1Ife-nzà nke mara umu Josef siri na Jọdan pua Jeriko, na miri Jeriko n'ọwuwa-anyanwu, bú ọzara ahu, nēsi na Jeriko rigo n'ugwu rue Bet-el; 2o si na Bet-el pua rue Luz, gabiga rue ókè-ala ndi-Akait rue Atarot; 3ọ rida n'akuku Ọdida-anyanwu rue ókè-ala ndi-Jafletait, rue ókè-ala Bet-horon di n'okpuru, rue Gezea: ọpupu-ya we di n'oké osimiri. 4Umu Josef, bú Manase na Efraim, we keta nke ha. 5Ókè-ala umu Efraim, dika ab͕uru nile ha si di, we di otú a: ókè-ala nke ihe-nketa-ha n'akuku ọwuwa-anyanwu bu Atarot-ada, rue Bet-horon di n'elu; 6ókè-ala ahu we pua n'akuku Ọdida-anyanwu na Mikmetat n'Ugwu; ókè-ala ahu we b͕a buruburu n'akuku ọwuwa-anyanwu, rue Taanat-shailo, we gabiga ya n'akuku ọwuwa-anyanwu Janoa; 7o si na Janoa rida rue Atarot, ru kwa Naarah, metu Jeriko, we pua na Jọdan. 8Ókè-ala ahu siri na Tapua je n'akuku Ọdida-anyanwu rue miri-iyi Kena; ọpupu-ya we di n'oké osimiri. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Efraim dika ab͕uru nile ha si di; 9tiyere obodo nile akpaputara umu Efraim n'etiti ihe-nketa nke umu Manase, obodo ahu nile na obodo ntà nile ha. 10Ma ha anapughi ndi Kenean ndi bi na Gezea ala-ha: ndi Kenean we biri n'etiti Efraim, rue ta, ghọ ndi nēfè òfùfè orù.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JOSHUA 16: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye