Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 9

9
1Job we za, si,
2N'ezie amawom na ọ di otú a:
Ma madu, ò gēsi aṅa buru onye ezi omume n'iru Chineke?
3Ọ buru na ọ tọ ya utọ iso Ya je n'ikpé,
Ọ gaghi-aza Ya otù okwu nime nnù okwu abua na ọgu iri.
4O nwere obi nke mara ihe, Ọ nāb͕a kwa ume n'ike:
Ònye mere onwe-ya ka o sie ike imegide Ya, we nọ n'udo?
5Onye nākwapu ugwu, ma ha amaghi ya,
Mb͕e Ọ kwatuworo ha n'iwe-Ya.
6Onye nēme ka uwa me nkpatu pua n'ọnọdu-ya,
Ogidi-ya nile we ma jijiji.
7Onye nāgwa anyanwu okwu, o we ghara iwa;
Ọ nākachi kwa kpakpando akàrà.
8Onye nání Ya nēseti elu-igwe,
Nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke oké osimiri ukwu.
9Onye nēme Bear, na Orion, na Pleiades,
Na ime-ulo nke Ndida.
10Onye nēme ihe uku, rue mb͕e ngwuputa ala-ha nādighi;
Na oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu nādighi.
11Le, Ọ nāgabiga n'akukum, ma adighm-ahu Ya:
Ọ nāga kwa n'iru, ma adighm-amata Ya.
12Le, Ọ nānwude ihe, ònye gēme ka Ọ laghachi azu?
Ònye gāsi Ya, Gini ka I nēme?
13Chineke agaghi-eme ka iwe-Ya laghachi;
Ndi nēyere Rehab aka ruru ala n'okpuru Ya.
14Mù onwem gēsi kwa aṅa za Ya,
Rọputa kwa okwum nile m'gāgwa Ya?
15Onye, ọ buru na abum onye ezi omume, m'gaghi-aza Ya;
Kama m'gāriọ onye nēkpem ikpe aririọ-amara.
16Ọ buru na m'kpọwo òkù, O we zam;
M'gaghi-ekwe kwa na Ọ ṅara nti n'olum;
17Bú Onye nēji oké ifufe chifiam aru,
Onye nēme kwa ka ob͕ub͕u-mmam, bú nke eb͕urum, ba uba n'efù.
18Ọ gaghi-ekwem ka m'turu ndu,
Kama Ọ nēme ka afọ jum n'ihe-ilu nile.
19Ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ike nke onye nwe ume, le, Ọ nọ ya!
Ma ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ikpé, ònye gākaram mb͕e?
20Ọ buru na abum onye ezi omume, ọnum gāmam ikpe:
Onye zuru okè ka m'bu, o we si na abum onye b͕agọrọ ab͕agọ.
21Onye zuru okè ka m'bu; adighm-amara nkpuru-obim;
Ajum ndum.
22Otù ihe aju ka ọ bu; n'ihi ya ka m'siri,
Onye zuru okè na onye nēmebi iwu ka Ya onwe-ya nēme ka ha gwusia.
23Ọ buru na utari eme ka madu nwua n'otù ntabi-anya,
Ọ gāchì onwunwa onye nēmeghi ihe ọjọ ọchì.
24Enyewo uwa n'aka onye-nmehie:
Ọ nēkpuchi iru ndi-ikpe-ya;
Ọ buru na ọ bughi Ya, ònye kwa ka ọ bu?
25Ma ubọchim nile di garagara kari ọb͕a-ọsọ:
Ha ab͕alagawo, ha ahughi ezi ihe.
26Ha agabigawo n'iru dika ub͕o amì:
Dika ugo si efedakwasi ngwa ngwa n'anu ọ gēri.
27Ọ buru na asim, Ka m'chezọ ntamum,
Ka m'rapu iru ujọm, b͕asa irum:
28Anamatu ujọ ihe-nb͕um nile,
Amawom na I gaghi-agum n'onye nēmeghi ihe ọjọ.
29Agama mu onwem ikpe;
N'ìhi gini kwa ka m'dọb͕uru onwem n'ọlu n'efu?
30Ọ buru na ewerem miri snow sa arum,
Were kwa nchà me ka ọbu-akam abua di ọcha;
31Mb͕e ahu I gābiayem n'olùlù,
Uwem gākpọkwam ihe-árú.
32N'ihi na Ọ bughi madu, otú m'bu, na m'gāza Ya,
Na ayi gābiakota n'ikpé.
33Ọ dighi odozi-okwu di n'etiti ayi,
Nke gātukwasi ayi abua aka-ya.
34Ya wezuga nkpa-n'aka-Ya n'arum,
Ka oké ujọ-Ya ghara ime ka m'tua egwu nke-uku:
35Ka m'kwue okwu, ghara itu egwu Ya;
N'ihi na ọ bughi otú a ka m'di n'ebe mu onwem nọ.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JOB 9: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye