Job we za Jehova, si,
Amawom na I puru ime ihe nile,
Amawokwam na adighi-eb͕ochi nzube ọ bula nke sitere na Gi.
Ònye bu onye a nke nēzobe ndum-ọdu n'enweghi ọmuma-ihe?
N'ihi ya ka m'gosiworo ihe nke m'nādighi-aghọta,
Ihe dikaririm ebube, nke m'nādighi-amata.
Biko, nuru, mu onwem gēkwu kwa;
M'gāju Gi, Gi me kwa ka m'mara.
Site n'ọnunu nti ka m'nuru Gi;
Ma ub͕u a anyam ahuwo Gi.
N'ihi nka ka m'nāju onwem aju, we chègharia
N'elu ájá na ntu.
O rue, mb͕e Jehova gwasiri Job okwu ndia, na Jehova siri Elifaz, bú onye Timan, Iwem di ọku megide gi, megide kwa ndi-eyì-gi abua: n'ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuworo. Ma ub͕u a, chirinu n'onwe-unu oke-ehi asa na ebulu asa, jekuru orùm, bú Job, surere onwe-unu àjà-nsure-ọku; Job, bú orùm, gēkpe kwa ekpere bayere unu; n'ihi na n'ezie ọ bu ya ka M'gāhu iru-ọma, ka M'ghara imeso unu dika nzuzu-unu si di; n'ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuru. Elifaz, bú onye Timan, na Bildad, bú onye Shua, na Zofa, bú onye Neama, we je, me dika Jehova gwara ha: Jehova we hu Job iru-ọma. Jehova me-kwa-ra ka ndọta-n'agha Job lata, mb͕e o kpere ekpere bayere ndi-eyì-ya: Jehova we tukwasi n'ihe nile Job nwere okpùkpù abua.