JOB 42:1-10
JOB 42:1-10 Bible Nso (IGBOB)
Job we za Jehova, si, Amawom na I puru ime ihe nile, Amawokwam na adighi-eb͕ochi nzube ọ bula nke sitere na Gi. Ònye bu onye a nke nēzobe ndum-ọdu n'enweghi ọmuma-ihe? N'ihi ya ka m'gosiworo ihe nke m'nādighi-aghọta, Ihe dikaririm ebube, nke m'nādighi-amata. Biko, nuru, mu onwem gēkwu kwa; M'gāju Gi, Gi me kwa ka m'mara. Site n'ọnunu nti ka m'nuru Gi; Ma ub͕u a anyam ahuwo Gi. N'ihi nka ka m'nāju onwem aju, we chègharia N'elu ájá na ntu. O rue, mb͕e Jehova gwasiri Job okwu ndia, na Jehova siri Elifaz, bú onye Timan, Iwem di ọku megide gi, megide kwa ndi-eyì-gi abua: n'ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuworo. Ma ub͕u a, chirinu n'onwe-unu oke-ehi asa na ebulu asa, jekuru orùm, bú Job, surere onwe-unu àjà-nsure-ọku; Job, bú orùm, gēkpe kwa ekpere bayere unu; n'ihi na n'ezie ọ bu ya ka M'gāhu iru-ọma, ka M'ghara imeso unu dika nzuzu-unu si di; n'ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuru. Elifaz, bú onye Timan, na Bildad, bú onye Shua, na Zofa, bú onye Neama, we je, me dika Jehova gwara ha: Jehova we hu Job iru-ọma. Jehova me-kwa-ra ka ndọta-n'agha Job lata, mb͕e o kpere ekpere bayere ndi-eyì-ya: Jehova we tukwasi n'ihe nile Job nwere okpùkpù abua.
JOB 42:1-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, Job zara ONYENWE ANYị sị: “Amara m na ị pụrụ ime ihe niile; ọ dịghị atụmatụ gị nke a pụrụ ikposa. Ị jụrụ sị, ‘Onye bụ onye nke a ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ihe?’ Nʼezie, ekwuru m banyere ihe ndị m na-aghọtaghị, ihe ndị dị oke ebube karịa m ịmata. “Ị sịrị, ‘Gee ntị ugbu a, aga m ekwu okwu; m ga-ajụ gị ajụjụ, gị onwe gị ga-azakwa m.’ Ntị m nụrụ ihe banyere gị ma ugbu a, ejirila m anya abụọ hụ gị. Ya mere, ana m akpọ onwe m asị, na echegharịkwa nʼime ntụ na uzuzu.” Mgbe ONYENWE ANYị gwasịrị Job okwu, ọ tụgharịrị gwa Elifaz onye Teman okwu sị ya, “Ana m ewesa gị na ndị enyi gị abụọ iwe, nʼihi na ihe unu kwuru banyere m ezighị ezi dịka nke ohu m Job kwuru. Ugbu a, werenụ oke ehi asaa na ebule asaa, jekwuru ohu m bụ Job ka o jiri ha chụọrọ unu aja nsure ọkụ, ohu m bụ Job ga-ekpekwara unu ekpere. Aga m anabatakwa ekpere ọ ga-ekpe nʼihi unu. Agaghị m alakwa unu nʼiyi nʼihi okwu nzuzu unu. Unu ekwughị ihe ziri ezi banyere m dịka ohu m Job si kwuo.” Ya mere, Elifaz onye Teman, na Bildad, onye Shu, na Zofa, onye Naaman mere dịka ONYENWE ANYị si nye ha nʼiwu. ONYENWE ANYị nabatakwara ekpere nke Job kpere nʼihi ndị enyi ya. Mgbe Job kpesịrị ekpere maka ndị enyi ya, ONYENWE ANYị mekwara ka ọ baa ụba ọzọ. O nyekwara ya okpukpo abụọ nke ihe niile o nwere na mbụ.