Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 34

34
1Elaihu we nāza, si,
2Ndi-amam-ihe, nurunu okwum nile;
Ndi mara ihe kwa, ṅanun nti.
3N'ihi na nti nānwa okwu nile,
Okpo-ọnu nēdetu kwa ihe-oriri.
4Ka ayi rọputara onwe-ayi ikpé:
Ka ayi mara n'etiti onwe-ayi ihe di nma.
5N'ihi na Job siri, Abum onye ezi omume,
Ma Chineke ewezugawo ikpém:
6M'gēkwu okwu-ugha megide ikpém?
Ọnyá-àkum adighi ngwọta, ọ bu ezie na njehie adighi.
7Òle madu di ka Job?
Ọ nāṅu ichì-ọchì dika miri,
8Nēso kwa ndi nālu ajọ ihe ga ije, buru onye ejikọtara ya na ha,
O we so ndi nēmebi iwu jeghari.
9N'ihi na ọ siri, Ọ dighi ihe ọ bara madu
Mb͕e ihe Chineke nātọ ya utọ.
10N'ihi nka, unu ndi nwere obi, genum nti:
Ya buru Chineke ihe-árú, bú imebi iwu;
Ya buru kwa Onye puru ime ihe nile ihe-árú, bú ime ajọ omume.
11N'ihi na ọlu madu ka Ọ gākwughachi ya,
Na dika uzọ nwoke si di, otú a ka Ọ gēme ka ọ huta.
12E, n'ezie, Chineke agaghi-emebi iwu,
Onye puru ime ihe nile agaghi-eme kwa ka ikpé buru ajọ omume.
13Ònye mere Ya onye-nlekọta uwa?
Ma-ọbu ònye doro elu-uwa dum madu bi?
14Ọ buru na Ọ tukwasi ya obi-Ya,
Ọ buru na Ọ chikọta mọ-ya na iku-ume-ya n'ebe Ọ nọ;
15Anu-aru nile gēkubìkọ ume,
Mdu gālaghachi kwa n'ájá.
16Ma ọ buru na i nwere nghọta, nuru nka:
Ṅa nti olu okwum nile.
17Ọzọ, onye nākpọ ezi ikpé asì, ọ̀ gāchi achi?
Ma-ọbu ì gāma Onye ezi omume di ike ikpe?
18Àgāsi eze, Gi onye jọb͕uru onwe-gi?
Àgāsi ndi amara aha-ha, Unu ndi-nmebi-iwu?
19Àgāsi kwa Ya otú a, bú Onye nādighi-ahu ndi-isi iru-ọma,
Nke nādighi-amata kwa ọgaranya kari onye nēnweghi ike?
N'ihi na ọlu nke aka-Ya ka ha nile bu.
20N'otù ntabi-anya ka ha gānwu, ọbuná n'etiti abali;
Anēme ka ndi ahu me nkpatu, ha nāgabiga kwa,
Anēwezuga kwa onye di ike, nēweghi aka ọ bula.
21N'ihi na anya-Ya dikwasi uzọ nile nke madu,
Nzọ-ukwu-ya nile ka Ọ nāhu kwa.
22Ọ dighi ọchichiri di, ọ dighi kwa onyinyo ọnwu di,
Ebe ndi nālu ajọ ihe gēzo onwe-ha.
23N'ihi na Ọ dighi-atukwasi madu ihe ọzọ,
Ọ bu nání ijekuru Chineke n'ikpé.
24O nētijisi ndi di ike, ma ngwuputa-ala-ya adighi,
Ọ we neguzo ndi ọzọ n'ọnọdu ha.
25N'ihi ya Ọ nāmata ọlu nile ha;
O we nēkpù ha iru n'abali, ewe zọpia ha.
26Dika ndi nēmebi iwu ka O tiworo ha aka
N'ọnọdu ndi nāhu ha anya;
27N'ihi na ha esiwo n'iso Ya wezuga onwe-ha,
Ha eweghi kwa uche le uzọ-Ya nile anya:
28Ime ka iti-nkpu nke onye nēnweghi ike biarue Ya ruo,
Iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala ka Ọ nānu kwa.
29Mb͕e Ya onwe-ya nēme ka anọ jū, ònye gāma kwa ikpe?
Mb͕e O nēzobe iru-Ya, ònye gēkiri kwa Ya?
Ma ọ bu n'ebe mba nọ, ma-ọbu n'ebe madu nọ, n'otù aka ahu:
30Ka madu emeruru emeru we ghara ibu eze,
Ka ndi nēsiri ndi ahu ọnya we ghara idi.
31N'ihi na ọ̀ di onye ọ bula siworo Chineke,
Eburuwom ahuhu, m'gaghi-eme ajọ omume ọzọ:
32Ihe m'nāhughi, Gi onwe-gi zím ya:
Ọ buru na emewom ajọ omume, m'gaghi-eme kwa ya ọzọ?
33Ọ̀ bu site n'ebe i nọ ka Ọ gākwughachi, nke i nāju ya?
N'ihi na gi onwe-gi gārọputa, ọ bughi mu onwem: Ma ihe i maworo, kwue ya.
34Madu ndi nwere obi gāsim,
Ha na nwoke ọ bula mara ihe nke nēgem nti:
35Job, ọ bughi n'ọmuma-ihe ka o nēkwu,
Okwu-ya nile adighi kwa n'inwe-uche.
36Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na anwa Job rue mb͕e ebighi-ebi,
N'ihi na ọ nāzaghachi dika ajọ madu.
37N'ihi na ọ nātukwasi njehie n'elu nmehie-ya,
Ọ nāku aka-ya abua n'etiti ayi,
Nēme kwa ka okwu-ya ba uba megide Chineke.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JOB 34: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye