Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 28

28
1N'ihi na ebe ọla-ọcha si aputa di,
Na ebe nke diri ọla-edo ahu ha nānucha anucha.
2Anēsi n'ájá eweputa ígwè,
Anāwu kwa nkume ighọ ọla.
3Madu emewo ọchichiri ka o nwe ọgwugwu,
Rue nsọtu nile ka ya onwe-ya nēgwuputa kwa
Nkume nke oké ọchichiri na onyinyo ọnwu.
4O siwo n'ebe madu nọ dika ọbìa tua ọnu;
Ha bu ndi ukwu nke nāga aga nēchezọ;
Anākwuba ha udọ̀ n'ebe di madu anya, ha nākwufeghari.
5Ala, nime ya ka nri si aputa:
Ma n'okpuru ya ka atughariworo ya dika ọ bu ọku mere ya.
6Ọnọdu sapphire ka nkume-ya nile bu,
Ọ nwe-kwa-ra ájá ọla-edo.
7Ọ bu uzọ nke udele nāmaghi,
Anya agu-nkwọ ahughi kwa ya:
8Anu-ọhia di nganga azọghi ya ukwu,
Ọdum nāb͕ọ uja agabigaghi kwa n'elu ya.
9Oké nkume ọmu ka o setipuworo aka-ya imegide;
Okpùwo ugwu iru site na nkpọrọgwu-ha.
10N'oké nkume nile ka ọ waputaworo uzọ miri si erù;
Anya-ya ahuwo kwa ihe ọ bula di oké ọnu-ahia.
11O kechiwo osimiri ka ha ghara itu miri;
Ihe-nzuzo ka ọ nēme kwa ka ọ puta ìhè.
12Ma amam-ihe, òle ebe agāchọputa ya?
Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta?
13Madu amaghi ọ̀rùrù-ọnu-ya;
Agaghi-achọta kwa ya n'ala ndi di ndu.
14Ob͕u-miri siri, Ọ bughi nimem ka ọ di:
Oké osimiri si-kwa-ra, Ọ dighi n'akam.
15Adighi-enye ọla-edo makarisiri nma n'ọnọdu ya,
Adighi-atù kwa ọla-ọcha ibu ọnu-ahia-ya.
16Adighi-eji ọla-edo ọma nke Ofia,
Adighi-eji kwa onyx di oké ọnu-ahia, ma-ọbu sapphire, tù ya.
17Adighi-ewere ọla-edo na enyo turu ya:
Ihe ọla-edo anuchara anucha abughi kwa ihe-nb͕anwe-ya.
18Agaghi-ehota coral na crystal:
E, nnweta amam-ihe kariri ruby.
19Adighi-ewere topaz nke Etiopia turu ya,
Adighi-eji ọla-edo ọma anāgwaghi agwa tù ya.
20Ma amam-ihe, òle ebe o si bia?
Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta?
21N'ihi na ezonariwo ya n'anya ihe nile di ndu,
Esiwo kwa n'anu-ufe nke elu-igwe zopu ya.
22Ebe-ila-n'iyì na ọnwu siri,
Na nti-ayi ka ayi nuworo akukọ-ya.
23Chineke aghọtawo uzọ-ya,
Ya onwe-ya amawo kwa ọnọdu-ya.
24N'ihi na Ya onwe-ya nēlegide ihe anya rue nsọtu nile nke uwa,
N'okpuru elu-igwe nile ka Ọ nāhu ihe;
25Imere ifufe ihe-ọtùtù;
Miri ka Ọ tùwo-kwa-ra n'ọtùtù.
26Mbe Ọ tọrọ ukpuru nye miri-ozuzo,
Dozi kwa uzọ nye àmùmà nke éb͕è-elu-igwe:
27Mb͕e ahu ka Ọ huru ya, we kọ akukọ-ya;
O mere ka o guzosie ike, O gwuputara ala-ya.
28O we si madu,
Le, egwu Onye-nwe-ayi, nke ahu bu amam-ihe;
Ọzọ, isi n'ihe ọjọ puta bu nghọta.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JOB 28: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye