Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 27

27
1Job we malite itu ilu-ya ọzọ, si,
2Chineke nādi ndu, Onye wezugara ikpém;
Onye puru ime ihe nile nādi kwa ndu, bú Onye mere ka nkpuru-obim di ilu;
3(N'ihi na ogologo mb͕e nile umem di nimem,
Mọ nke Chineke di kwa n'imem;)
4N'ezie eb͕ub͕ere-ọnum adighi-ekwu okwu ajọ omume,
Irem adighi-atamu kwa ntamu aghughọ.
5Ya burum ihe-árú ọ buru na aguam unu na ndi ezi omume:
Rue mb͕e m'kubìri ume m'gaghi-esi n'ebe m'nọ wezuga izu-okèm.
6Ezi omumem ka m'jideworo, m'gaghia ara kwa ya aka:
Obim adighi-atam uta bayere otù n'ubọchim nile.
7Ka onye-irom di ka onye nēmebi iwu,
Ka onye nēbili imegidem di kwa ka onye ajọ omume.
8N'ihi na gini bu olile-anya onye emeruru emeru, mb͕e Chineke nēbipu ya,
Mb͕e Chineke nēsepu nkpuru-obi-ya?
9Chineke, Ọ̀ gānu iti-nkpu-ya,
Mb͕e nkpab͕u nābiakwasi ya?
10Ìhe nke Onye puru ime ihe nile gātọ ya utọ?
Ọ̀ gākpọku Chineke na mb͕e nile?
11M'gēzí unu ihe site n'aka Chineke;
M'gaghi-ezobe ihe nke di n'aka Onye puru ime ihe nile.
12Le, unu onwe-unu nile ahuwo ya;
N'ìhi gini kwa ka unu nāghọsi ihe-efu?
13Nka bu òkè madu nēmebi iwu n'ebe Chineke nọ,
Na ihe-nketa nke ndi nēme ka madu ma jijiji, nke ha nānara n'aka Onye puru ime ihe nile.
14Ọ buru na umu-ya amuba, ọ bu inye mma-agha;
Umu nke putara n'aru-ya agaghi-eriju kwa nri afọ.
15Agēli ndi-ya fọduru n'ọnwu,
Ndinyom-ya di-ha nwuru agaghi-akwa ákwá.
16Ọ buru na ọ kwakọba ọla-ọcha dika ájá,
Dozie uwe dika urọ;
17O gēdozi ya, ma onye ezi omume gēyi ya,
Onye nēmeghi ihe ọjọ gēkè kwa ọla-ọcha.
18O wuwo ulo-ya dika nla,
Na dika ulo-ntu nke onye-nche meworo.
19O nēdina buru ọgaranya, ma agaghi-achikọta ya;
Ọ saghewo anya ya abua, ma ọ nọghi.
20Ihe-egwu nēru ya aru dika miri;
Oké ifufe ezupuwo ya n'abali.
21Ifufe Iru-anyanwu nēburu ya, o we la;
O we fechapu ya n'ọnọdu-ya.
22Chinke gātu kwa ya ihe, ghara kwa inwe ọmiko n'aru-ya:
N'aka-Ya ka o gēsi b͕alaga ab͕alaga.
23Madu gākuru ya aka,
Ma ya ọsọ chupu ya n'ọnọdu-ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JOB 27: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye