Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 24

24
1Gini mere Onye puru ime ihe nile nējighi tukọba mb͕e?
Gini mere ndi mara Ya nējighi hu ubọchi-Ya nile?
2Ufọdu nēwezuga ókè-ala;
Ha anapuwo kwa ìgwè aturu n'ike, we nāzù ha.
3Ha nākpupu inyinya-ibu nke umu-nb͕ei,
Ha nānara kwa ehi nke nwayi di-ya nwuru n'ihe-ibe.
4Ha nēsi n'uzọ wezuga ndi-ob͕eye:
Ndi ewedara n'ala nke uwa ezobekowo onwe-ha n'otù.
5Le, dika inyinya-ibu-ọhia n'ọzara
Ka ha nāpu ije ọlu-ha, nāchọsi nri-ọtita-ha ike;
Ala ihe nādighi nēmere ha nri umu-ha gēri.
6N'ọhia ka ha nile n'otù n'otù nwe nri-ha agwara agwa dika ihe-ubi;
Ha nātutukọ kwa nkpuru-vine fọduru n'ubi-vine onye nēmebi iwu.
7Ha nānọ ọnọdu-abali b͕ara ọtọ nēnweghi uwe,
Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ha nwere n'oyi.
8Oké miri-ozuzo nke ugwu nēde ha,
Ma ebe ha nēnweghi ebe-nb͕abà, ha we b͕akua oké nkume.
9Ufọdu nānapu nwa-nb͕ei n'ara n'ike,
Nara kwa onye ewedara n'ala ihe-ibe:
10Ha we nējeghari b͕ara ọtọ nēnweghi uwe,
N'agu-ha ka ha nēbu kwa ùkwù-ọka;
11N'etiti mb͕idi-ha ka ha nāpi manu;
Ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile ha ka ha nāzọ ukwu, ma akpiri nākpọ ha nku.
12Ha nēsi n'obodo ndikom sua udè,
Nkpuru-obi ndi emeruworo aru nētiku Chineke:
Ma Chineke adighi-agu ya n'ihe-nzuzu.
13Ndi ahu nọ n'etiti ndi nānupu isi n'okpuru ìhè;
Ha amataghi uzọ-ya nile,
Ha ebighi kwa n'okporo-uzọ-ya nile.
14Ìhè ututu ka ob͕u-madu ji bilie, o nēb͕u onye ewedara n'ala na ob͕eye;
N'abali kwa ọ di ka onye-ori.
15Ọzọ, anya onye nākwa iko nāriba chi-ojiji ama,
Si, Ọ dighi anya ọ bula gēkirim:
Ọ nēzobe iru-ya.
16O gwupúwo ulo n'ọchichiri:
N'ehihie ha nēmechibido onwe-ha uzọ;
Ha amaghi ìhè.
17N'ihi na ututu buru usu ha nile onyinyo ọnwu;
N'ihi na ọ nāmata ihe-egwu nile nke onyinyo ọnwu.
18Onye di nfe n'elu miri ka ọ bu;
Anākọcha òkè-ha n'uwa:
Ọ dighi-eche uzọ ubi-vine iru.
19Ikpọ-nku na okpom-ọku nānapu miri snow n'ike:
Otú a ka ala-mọ nēme ndi mehieworo.
20Àkpà-nwa gēchezọ ya, aru-ya gātọ ikpuru utọ n'oriri;
Agaghi-echeta kwa ya ọzọ:
Agānyaji kwa ajọ omume dika osisi.
21Ọ nēmeb͕u nwayi-àgà nke nādighi-amu nwa;
Ọ dighi-eme kwa nwayi di-ya nwuru nma.
22Ma O mewo ka ndi di ike nke-uku nādigide ndu site n'ike-Ya:
O nēbili, ma ọ dighi onye kwere na ọ gādi ndu.
23Chineke nēme ka ọ nọ na ntukwasi-obi, ọ nādabere kwa na ya;
Ma anya-Ya dikwasi n'uzọ nile ha.
24Ha di elu; na nwa mb͕e ha anọghi;
Akwadawo kwa ha, chikọba ha dika madu nile,
Ewe bipu ha dika ọnu-ọnu oko ọka.
25Ma ọ buru na ọ dighi otú a ub͕u a, ònye gēme ka amara na abum onye-ugha,
Me okwum ka ọ buru ihe-efu?

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JOB 24: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye