Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 15

15
1Elifaz, bú onye Timan, we za, si,
2Onye mara ihe, ọ̀ gēwere ọmuma-ihe nke bu nání ifufe za?
Ọ̀ gēmeju kwa afọ-ya n'ifufe Iru-anyanwu?
3Ọ̀ gēwere okwu nābaghi n'ihe ru uka,
Ma-ọbu okwu nke ọ nējighi ha bara madu urù?
4E, gi onwe-gi nēmebi egwu,
Nēbilata kwa ntughari-uche n'iru Chineke.
5N'ihi na ajọ omume-gi nēzi ọnu-gi ihe,
I nārọputa kwa ire ndi-aghughọ.
6Ọnu-gi nāma gi ikpe, ọ bughi mu onwem;
Eb͕ub͕ere-ọnu-gi nāza kwa imegide gi.
7Ì bu madu mbu amuru?
Ma-ọbu àmuputara gi tutu ugwu adi?
8Ọ̀ bu ìzù nzuzo Chineke ka i nēge nti?
Ì nēbilata-kwa-ra onwe-gi amam-ihe?
9Gini ka i mara nke ayi nāmaghi?
Ì nāghọta ihe nke nādighi nime ayi?
10Ma onye-isi-awọ ma onye kara nká nọ n'etiti ayi,
Ndi ubọchi ndu-ha ka nke nna-gi nke-uku.
11Ǹkasi-obi Chineke adikara gi ntà,
Ha na okwu nke nēmeso gi nwayọ?
12Gini mere obi-gi ji ebupu gi?
Gini me-kwa-ra anya-gi abua ji atabi?
13Na i nēchighari mọ-gi imegide Chineke,
We me ka okwu nile di otú a si n'ọnu-gi puta.
14Gini ka madu bu, na ọ gādi ọcha n'obi,
Na ọ gābu kwa onye ezi omume, bú onye nwayi muru?
15Le, ọbuná ndi nsọ Ya ka Ọ nādighi-atukwasi obi;
Ọzọ, elu-igwe adighi ọcha n'anya-Ya.
16Ònye-árú nke b͕aruru ab͕aru dika miri gēsi kwa aṅa di ọcha n'anya-Ya,
Bú madu nke nāṅu ajọ omume dika miri?
17M'gēkwuputara gi, gem nti;
Ma nka ka m'huworo, m'gākọ kwa ya:
18(Nke ndi mara ihe nēgosi
Site na ndi bu nna-ha, ha ezoghi kwa ya;
19Ndi ahu, náni ha, ka enyere ala,
Ọ dighi kwa ọbìa gabigara n'etiti ha:)
20Ubọchi nile nke onye nēmebi iwu ka onye ahu nāb͕ali,
Bú ọnu-ọgugu arọ nke ezobeworo nye onye nēme ka madu ma jijiji.
21Olu oké egwu di na nti-ya abua;
Mb͕e ọ nọ n'udo ka onye nāpunara madu ihe gābiakute ya:
22Ọ dighi-ekwe na ọ gēsi n'ochichiri lata,
Onye anēche nche inye mma-agha ka ọ bu:
23Onye nāwaghari ichọ nri ka ọ bu, ọ nāsi, Òle ebe ọ di?
Ọ mawo na edoziwo ubochi ọchichiri n'aka-ya:
24Ahuhu na nkpà nēme ka ọ tua egwu nke-uku;
Ha nwere ike n'aru ya, dika eze nke nọ na njikere ibu agha:
25N'ihi na o setipuwo aka-ya imegide Chineke,
Ọ bu kwa imegide Onye Nke puru ime ihe nile ka ọ nēme onwe-ya onye di ike;
26Ọ nēwere olu kwesiri ike b͕akwasi Ya,
Were kwa ihe-nb͕ochi di ib͕idi nke ọta-ya:
27Nihi na o werewo abuba-ya kpuchie iru-ya,
Me ka abuba nke di arọ́ di n'úkwù-ya;
28O we biri n'obodo ezopuru n'uwa,
Nime ulo nke madu nādighi-ebi nime ha,
Nke ejikereworo ighọ obo-ihe.
29Ọ gāghi-abu ọgaranya, àkù-ya adighi-eguzosi kwa ike,
Ọ dighi-eseti kwa ihe ha nwere n'uwa.
30Ọ gaghi-esi n'ọchichiri wezuga onwe-ya;
Ire-ọku gēme ka ome-ya kpọ nku,
Ọ gēwezuga kwa onwe-ya site n'iku-ume nke ọnu-Ya.
31Ka ọ ghara ikwere n'ihe-efu, eduhiewo ya:
N'ihi na ihe-efu gābu ihe-nb͕anwe-ya.
32Tutu ubọchi-ya erue ka agēmezu ya,
Alaka-ya agaghi-adi ka ahihia ndu.
33Ọ gēnwosisi nkpuru-vine-ya nke nāchaghi acha, dika osisi vine,
Ọ gātuda kwa okoko-osisi-ya, dika osisi olive.
34N'ihi na nzukọ nke onye emeruru emeru gābu ndi nāpughi imu nwa,
Ọku gēripia ulo-ikwū nile nke ndi-ngo.
35Ha nāturu ime ọnọdu ọjọ, mua ajọ ihe,
Afọ-ha nēdozi kwa aghughọ.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JOB 15: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye