Ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we kuta otù nwanyi nke ejidereri n'ikwa-iko; mb͕e ha guzosiri ya n'etiti, ha we si Ya, Onye-ozizí, ejidewo nwanyi a n'ikwa-iko, mb͕e ọ nēme ihe ahu. Ma n'iwu-ayi Moses nyere ayi iwu itu ndinyom di otú a nkume: gini kwa ka Gi onwe-gi nēkwu bayere ya? Ma nka ka ha nēkwu inwa Ya, ka ha we nwe ihe ha gēji bo Ya ebubo. Ma Jisus ruru ala, were nkpisi-aka-Ya nēde ihe n'ala. Ma mb͕e ha nọgidere nāju Ya, O welie Onwe-ya elu, si ha, Onye akēmehieghi n'etiti unu, ya buru uzọ tu ya nkume. O we ruru kwa ala ọzọ, were nkpisi-aka-Ya nēde ihe n'ala. Ma mb͕e ha nuru ya ha pua n'otù n'otù, malite na ndi bu okenye, rue ndi-ikpe-azu: ewe rapu nání Jisus, Ya na nwanyi ahu, ebe o guzoro, n'etiti. Jisus we welie Onwe-ya elu, si ya, Nwanyi, òle ebe ha nọ? ọ̀ dighi onye ọ bula mara gi ikpé? O we si, Ọ dighi onye ọ bula, Onye-nwe-ayi. Jisus we si, Mu onwem amaghi kwa gi ikpé: ga nke gi. site n'ub͕u a adila nēmehie ọzọ.
Gụọ JỌN 8
Geere nke a ntị JỌN 8
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JỌN 8:3-11
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị