Ya mere nwanyi Sameria ahu si Ya, Gì onwe-gi si aṅa ariọ miri n'akam ka I ṅua, ebe I bu Onye-Ju, ma mu bu nwanyi Sameria? (N'ihi na ndi-Ju na ndi Sameria adighi-emekọ ihe.) Jisus zara, si ya, Ọ buru na i matara onyinye Chineke, na Onye Ọ bu Nke nāsi gi, Nyem miri ka M'ṅua; gi onwe-gi gāriọ Ya-ri, Ọ gēnye kwa gi miri di ndu. Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, I nweghi ihe isere miri, ma olùlù-miri a di omimi: òle ebe kwa ka I nwere miri ahu di ndu? Ọ̀ gābu na Gi onwe-gi ka nna-ayi Jekob uku, onye nyere ayi olùlù-miri a; ya onwe-ya, na umu-ya, na anu-ulo-ya, ṅu-kwa-ra nime ya? Jisus zara, si ya, Onye ọ bula nke nāṅu miri a, akpiri gākpọ ya nku ọzọ: ma onye ọ bula nke gāṅu miri ahu nke Mu onwem gēnye ya, akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi; kama miri ahu nke Mu onwem gēnye ya gāghọ nime ya isi-iyi miri nāsuputa ri nne rue ndu ebighi-ebi.
Gụọ JỌN 4
Geere nke a ntị JỌN 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JỌN 4:9-14
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị