Ma ọ bu ezie na O mereri ọtutu ihe-iriba-ama di otú a n'iru ha, ma ha ekweghi na Ya: ka okwu Aisaia onye-amuma we mezu, nke o kwuru, si,
Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo?
Ogwe-aka Onye-nwe-ayi kwa, n'àru onye ka ekpugheworo ya?
N'ihi nka ha apughi ikwere, n'ihi na Aisaia siri ọzọ,
O mewo ka anya-ha kpue ìsì, O me-kwa-ra ka obi-ha me etili;
Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere obi-ha ghọta,
Ghara kwa ichighari,
Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.
Ihe ndia ka Aisaia kwuru, n'ihi na ọ huru ebube-Ya; o kwu-kwa-ra okwu bayere Ya. Otú ọ di, ọbuná site n'etiti ndi-isi ọtutu kwere na Ya; ma n'ihi ndi-Farisi ha ekwuputaghi ya, ka aghara ichupu ha n'ulo-nzukọ: n'ihi na ha huru otuto madu n'anya kari otuto Chineke.
Jisus we tie nkpu, si, Onye kwere na Mu, ọ bughi na Mu ka o kwere, kama ọ bu n'Onye ziterem. Onye nāhum nāhu kwa Onye ziterem. Mu onwem abiawo n'uwa ibu ìhè, ka onye ọ bula nke kwere na Mu we ghara inọgide n'ọchichiri. Ọ buru kwa na onye ọ bula anu okwum, ghara idebe ha, Mu onwem agaghi-ekpe ya ikpé: n'ihi na abiaghm ka M'kpe uwa ikpé, kama ka M'zọputa uwa. Onye nājum, nke nādighi-anara kwa okwum, o nwere onye nēkpe ya ikpé: okwu nke M'kwuru, okwu ahu gēkpe ya ikpé n'ubọchi ikpe-azu. N'ihi na Mu onwem ekwughi site n'Onwem; kama Nna ziterem, Ya onwe-ya enyewom iwu, ihe M'gēkwu, na otú M'gēkwu ya. Amata-kwa-ram na ihe O nyere n'iwu bu ndu ebighi-ebi: ya mere ihe Mu onwem nēkwu, dika Nnam gwaworom okwu, otú a ka M'nēkwu.