JỌN 12:37-50 - Compare All Versions
JỌN 12:37-50 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼagbanyeghị ọrụ ịrịbama niile ọ rụrụ nʼetiti ha, ha ekwereghị na ya. Nke a bụ imezu ihe Aịzaya onye amụma kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?” Ma ha enweghị ike kwere, nʼihi na Aịzaya kwukwara nʼebe ọzọ, sị, “O meela ka ha kpuo ìsì, mekwa ka obi ha kpọchie Ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ maọbụ jiri obi ha ghọta ihe ọbụla Ka ha gharakwa ichigharị, ka m gwọọ ha.” Aịzaya kwuru ihe ndị a nʼihi na ọ hụrụ ebube ya, ma kwuo banyere ya. Otu ọ dị, ọtụtụ nʼime ndịisi kweere na ya, ma ha ekwupụtaghị nke a. Nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị Farisii ga-achụpụ ha site nʼụlọ ekpere. Nʼihi na ha hụrụ otuto mmadụ nʼanya karịa otuto Chineke. Jisọs tiri mkpu sị, “Onye ọbụla kwere na m, ọ bụghị na m ka o kwere, kama ọ bụ na onye nke zitere m. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ m ahụla onye nke zitere m. Abịara m nʼime ụwa dị ka ìhè ka onye ọbụla nke kwere na m ghara ịnọ nʼọchịchịrị. “Ma ọ bụrụ na onye ọbụla anụ okwu m ma ju ime ya, ọ bụghị m na-ekpe ya ikpe. Nʼihi na abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe. Onye ọbụla jụrụ m ma jụkwa okwu m, nwere onye ga-ekpe ya ikpe. Okwu niile m kwuru ga-ama ya ikpe nʼụbọchị ikpeazụ. Okwu ndị a esiteghị nʼaka m. Ha sitere nʼaka Nna ahụ onye zitere m ma nyekwa m iwu ihe m ga-ekwu na otu m ga esi kwuo ya. Ama m na iwu ya bụ ndụ ebighị ebi, nʼihi ya, ihe ọbụla Nna gwara m ka m na-ekwu.”
JỌN 12:37-50 IGBOB (Bible Nso)
Ma ọ bu ezie na O mereri ọtutu ihe-iriba-ama di otú a n'iru ha, ma ha ekweghi na Ya: ka okwu Aisaia onye-amuma we mezu, nke o kwuru, si, Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo? Ogwe-aka Onye-nwe-ayi kwa, n'àru onye ka ekpugheworo ya? N'ihi nka ha apughi ikwere, n'ihi na Aisaia siri ọzọ, O mewo ka anya-ha kpue ìsì, O me-kwa-ra ka obi-ha me etili; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike. Ihe ndia ka Aisaia kwuru, n'ihi na ọ huru ebube-Ya; o kwu-kwa-ra okwu bayere Ya. Otú ọ di, ọbuná site n'etiti ndi-isi ọtutu kwere na Ya; ma n'ihi ndi-Farisi ha ekwuputaghi ya, ka aghara ichupu ha n'ulo-nzukọ: n'ihi na ha huru otuto madu n'anya kari otuto Chineke. Jisus we tie nkpu, si, Onye kwere na Mu, ọ bughi na Mu ka o kwere, kama ọ bu n'Onye ziterem. Onye nāhum nāhu kwa Onye ziterem. Mu onwem abiawo n'uwa ibu ìhè, ka onye ọ bula nke kwere na Mu we ghara inọgide n'ọchichiri. Ọ buru kwa na onye ọ bula anu okwum, ghara idebe ha, Mu onwem agaghi-ekpe ya ikpé: n'ihi na abiaghm ka M'kpe uwa ikpé, kama ka M'zọputa uwa. Onye nājum, nke nādighi-anara kwa okwum, o nwere onye nēkpe ya ikpé: okwu nke M'kwuru, okwu ahu gēkpe ya ikpé n'ubọchi ikpe-azu. N'ihi na Mu onwem ekwughi site n'Onwem; kama Nna ziterem, Ya onwe-ya enyewom iwu, ihe M'gēkwu, na otú M'gēkwu ya. Amata-kwa-ram na ihe O nyere n'iwu bu ndu ebighi-ebi: ya mere ihe Mu onwem nēkwu, dika Nnam gwaworom okwu, otú a ka M'nēkwu.