Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JEREMAIA 28

28
1O rue, n'arọ ahu, na nmalite ọbubu-eze Zedekaia, bú eze Juda, n'arọ nke-anọ, n'ọnwa nke-ise, na Hananaia nwa Azua, bú onye-amuma, nke sitere na Gibeon, gwaram okwu n'ulo Jehova, n'anya ndi-nchu-àjà na ndi Israel nile, si, 2Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru, si, Ab͕ajiwom yoke nke eze Babilon. 3Tutu ogologo arọ abua eruzue Mu onwem ganēbulata nēbe a ihe nile nke ulo Jehova, nke Nebukadneza, bú eze Babilon, siri n'ebe a bupu, we bubà ha na Babilon: 4ọzọ, Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, na ndi Juda nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi bàworo na Babilon, ndia ka Mu onwem gaje ime ka ha lata n'ebe a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na M'gab͕aji yoke nke eze Babilon. 5Jeremaia, bú onye-amuma, we si Hananaia, bú onye-amuma, n'anya ndi-nchu-àjà, na n'anya ndi Israel nile ndi nēguzo n'ulo Jehova, 6o we si, bú Jeremaia onye-amuma, Amen: Jehova me otú a: Jehova me ka okwu-gi nile guzosie ike, bú nke i buworo amuma, ime ka ihe nile nke ulo Jehova, na ndi nile emere ka je biri n'ala ọzọ, si na Babilon lata n'ebe a. 7Nání, biko, nuru okwua nke mu onwem nēkwu na nti-gi abua, na na nti ndi nka nile: 8Ndi-amuma ndi burum uzọ, ndi buru kwa gi uzọ, site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ha we bue amuma megide ọtutu ala, megide kwa ala-eze uku di iche iche, bayere agha, baye-kwa-ra ihe ọjọ, baye-kwa-ra ajọ ọria nēfe efe. 9Onye-amuma nke nēbu amuma bayere udo, mb͕e okwu onye-amuma ahu gērè, agāmara onye-amuma ahu, na Jehova ezitewo ya n'ezie. 10Hananaia, bú onye-amuma, we kopu nkpọrọ ahu n'olu Jeremaia, bú onye-amuma, we b͕ajie ya. 11Hananaia we kwue okwu n'anya ndi Israel nile, si, Otú a ka Jehova siri: Ọbuná otú a ka M'gāb͕ajipu yoke nke Nebukadneza, bú eze Babilon, n'olu mba nile tutu ogologo arọ abua eruzue. Jeremaia, bú onye-amuma, we la. 12Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, mb͕e Hananaia, bú onye-amuma, b͕ajipusiri nkpọrọ n'olu Jeremaia, bú onye-amuma, si, 13Je, gwa Hananaia okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Nkpọrọ osisi ka i b͕ajiworo; ma i mewo nkpọrọ ígwè n'ọnọdu ha. 14N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Yoke nke ígwè ka M'tukwasiworo n'olu mba nile ndia, ka ha we fè Nebukadneza, bú eze Babilon; ha gēfè kwa ya: ọzọ, anu ọhia ka M'nyeworo ya. 15Jeremaia, bú onye-amuma, we si Hananaia, bú onye-amuma, Biko, nuru, Hananaia; Jehova eziteghi gi; ma gi onwe-gi emewo ka ndi nka tukwasi okwu-ugha obi. 16N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje isi n'elu uwa zilaga gi: n'arọ a ka gi onwe-gi gānwu, n'ihi na okwu nwezuga ka i kwuworo megide Jehova. 17Hananaia, bú onye-amuma, we nwua n'arọ ahu n'ọnwa nke-asa.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JEREMAIA 28: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye