Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JEREMAIA 18

18
1Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, si, 2Bilie, rida n'ulo ọkpu-ite, ọ bu kwa n'ebe ahu ka M'gēme ka i nu okwum. 3M'we rida n'ulo ọkpu-ite, ma, le, ọ nēje ozi-ya n'elu wheel-ya abua. 4Ewe bibie ihe onye ahu ji urọ akpu n'aka ọkpu-ite ahu, o we kpu kwa ya ọzọ ihe di iche, dika o ziri ezi n'anya ọkpu-ite ahu ikpu ya.
5Okwu Jehova we ruem nti, si, 6Àpughm ime unu dika ọkpu-ite a mere, unu ulo Israel? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Le, dika urọ si di n'aka ọkpu-ite a, otú a ka unu onwe-unu di n'akam, unu ulo Israel. 7N'otù ntabi-anya ahu mb͕e M'nēkwu okwu bayere mba ọ bula, iropu ya na ikwada ya na ime ka ọ la n'iyì; 8ọ buru na mba ahu nke M'kwuworo okwu bayere ya esi n'ihe ọjọ ya chigharia, M'gēchèghari kwa n'ihe ọjọ ahu nke M'chère ime ya. 9Ọzọ, n'otù ntabi-anya ahu mb͕e M'nēkwu okwu bayere mba ọ bula, baye-kwa-ra ala-eze ọ bula, iwu ya dika ulo na iku ya dika osisi; 10ọ buru na o me ihe jọrọ njọ n'anyam, we ghara ige nti n'olum, M'gēchèghari kwa n'ezi ihe ahu, nke M'siri na M'gēji me ya nma. 11Ma ub͕u a, biko, gwa ndi Juda, gwa kwa ndi bi na Jerusalem, okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Le, Mu onwem nākpu ihe ọjọ megide unu, nēchè kwa èchìchè megide unu: biko, sinu, onye ọ bula n'uzọ ọjọ ya, lata, me kwa ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma. 12Ma ha siri, Ntukwasi-obi adigh: n'ihi na èchìchè nile nke ayi ka ayi nējeso, ayi nēme kwa, onye ọ bula ihe isi-ike nke obi ọjọ ya.
13N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Biko, juanu n'etiti mba nile, si, Ònye nuworo ihe di ka ndia? ihe jọb͕uru onwe-ya nke-uku ka nwa-ab͕ọghọ Israel nke nāmaghi nwoke meworo. 14Snow nke Lebanon, ọ̀ gārapu oké nkume nke ọhia? ma-ọbu miri oyi nke si n'ala ọzọ erù, ọ̀ gātada? 15N'ihi na ndim echezọwom, ihe-efu ka ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nye; ha we me ka ha su ngọngọ n'uzọ nile ha, bú uzọ-ije nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, ije ije n'okporo-uzọ di iche iche, bú uzọ anātulighi atuli; 16ime ka ala-ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ mb͕e ebighi-ebi; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, o gēfufe kwa isi-ya. 17Dika ifufe Iru-anyanwu ka M'gāchusa ha n'iru onye-iro; azu, ọ bughi iru, ka M'gēme ka hu ha n'ubọchi nhuju-anya-ha.
18Ha we si, Bianu, ka ayi chè èchìchè megide Jeremaia; n'ihi na iwu agaghi-esi n'ebe onye-nchu-àjà nọ la n'iyì, ndum-ọdu agaghi-esi kwa n'ebe onye mara ihe nọ, okwu agaghi-esi kwa n'ebe onye-amuma nọ. Bianu, ka ayi were ire-ayi tib͕ue ya, ma ka ayi ghara iṅa nti n'okwu-ya nile.
19Ṅam nti, Jehova, ge kwa nti olu ndi nālusom ọ̀gù. 20Àgākwughachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe? n'ihi na ha egwuworo nkpuru-obim olùlù. Cheta nguzo m'guzoro n'iru Gi ikwu ezi ihe bayere ha, ime ka ọnuma-Gi si n'aru ha laghachi. 21N'ihi nka were umu-ha nye oké unwu, rara kwa ha nye n'aka mma-agha; ka ndinyom-ha ghọ kwa ndi b͕ara aka nwa na ndi di-ha nwuru; ka ndikom-ha ghọ kwa ndi ọnwu b͕uru, ka umu-okorọbia-ha ghọ ndi etib͕uru na mma-agha n'agha. 22Ka anuru iti-nkpu nke gēsite n'ulo nile ha, mb͕e I gēme ka usu ndi nāpunara madu ihe biakwasi ha na mberebe: n'ihi na ha egwuwo olùlù inwudem, ha ezobewo-kwa-ra ukwum abua ib͕udu di iche iche. 23Ma Gi onwe-gi, Jehova, amawo ndum-ọdu nile ha imegidem ime ka m'nwua; ekpuchila ajọ omume-ha, ehichapu-kwa-la nmehie-ha n'iru Gi: ma ka ha ghọ ndi emeworo ka ha su ngọngọ n'iru Gi; meso ha na mb͕e iwe-Gi.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JEREMAIA 18: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye