Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JEREMAIA 10

10
1Nurunu okwu Jehova gwaworo unu, unu ulo Israel: 2Otú a ka Jehova siri, Unu amutala uzọ mba nile, unu atu-kwa-la ujọ ihe-iriba-ama di iche iche nke elu-igwe; n'ihi na mba nile nātu ujọ ha. 3N'ihi na ukpuru nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu: n'ihi na ọ bu nání osisi, nke madu b͕utuworo, ọlu aka abua nke onye-ọ̀kà ji anyu-ike alu ọlu. 4Ha ji ọla-ọcha, ji kwa ọla-edo, eme ya ka ọ ma nma; ha ji ǹtú, ji kwa otùtù, eme ya ka o sie ike, ka ọ we ghara isu ngọngọ. 5Ha di ka nkwu, ihe akpuru akpu ka ha bu, ha adighi-ekwu okwu: aghaghi ibu ha ebu, n'ihi na ha adighi-azọ ije. Unu atula egwu ha; n'ihi na ha agaghi-eme ihe ọjọ, ọzọ kwa, ime izi ihe adighi ha n'aka. 6Ọ dighi nke di ka Gi ma-ọli, Jehova; Onye uku ka I bu, ihe di uku ka aha-Gi di kwa n'idi-ike. 7Ònye nāgaghi-atu egwu Gi, Eze mba nile? n'ihi na Gi ka o kwesiri: n'ihi na n'etiti ndi-amam-ihe nile nke mba nile, na n'ala-eze nile ha, ọ dighi onye di ka Gi ma-ọli. 8Ma ha nile n'otù bu anu-ọhia na ndi-nzuzu: idọ-aka-na-nti nke ihe-efu, nání osisi ka ọ bu. 9Ọla-ọcha di nke etisaworo mbadamba nke anēsi na Tashish weta, na ọla-edo nke sitere n'Ufaz, bú ọlu onye-ọ̀kà na nke aka onye-nnucha-ọla: ákwà anunu na ákwà ododo bu uwe-oyiyi-ha; ọlu nke ndi mara ihe ka ha nile bu. 10Ma Jehova bu Chineke n'ezi-okwu; Ya onwe-ya bu Chineke di ndu, na eze nādi mb͕e ebighi-ebi: n'iwe-Ya uwa nāma jijiji, mba nile apughi kwa inagide iwe-Ya di ọku.
11Otú a ka unu gāsi ha, Chi nile nke nēmeghi elu-igwe na uwa, ha gāla n'iyì pua n'uwa na n'okpuru elu-igwe, bú chi ndia.
12Onye jiworo ike-Ya me uwa, Onye jiworo amam-ihe-Ya me ka elu-uwa dum madu bi guzosie ike, Onye jiworo nghọta-Ya setipu elu-igwe: 13mb͕e Ọ nēme ka olu-Ya da, ùzù miri di n'elu-igwe, O mee ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà, Ọ nēme kwa ka ifufe si n'ulo-nkwakọba-Ya nile puta. 14Nání anu-ọhia ka madu ọ bula ghọworo site n'ihe-ọmuma-ya; emewo ka ihere me onye-nnucha-ọla ọ bula site n'arusi-ya apiri api: n'ihi na okwu-ugha ka arusi-ya awuru awu bu, nku-ume adighi kwa nime ha. 15Ihe-efu ka ha bu, ọlu ikwa-emò: na mb͕e nleta-ha ha gāla n'iyì. 16Ọ bughi dika ihe ndia ka Òkè Jekob bu; n'ihi na onye nākpu ihe nile ka Ọ bu; Israel bu kwa ebo nke ihe-nketa-Ya: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.
17Chikọputa ihe-agha-gi n'ala, gi onye bi n'obodo anānọchigide n'agha. 18N'ihi na otú a ka jehova siri, Le, M'gaje imapu ndi bi n'ala nka dika èbè na mb͕e a, M'gākpab͕u kwa ha, ka ha we chọputa ha. 19Ahuhu dirim bayere nb͕aji ukwu na akam! ọnyám nke etiputa jọrọ njọ: ma mu onwem siri, N'ezie nka bu ọriam, m'gēburu kwa ya. 20Emebisiwo ulo-ikwūm, etibìsiwo kwa udọ̀m nile: umum esiwo n'ebe m'nọ pua, ha anọghi kwa: ọ dighi kwa onye nēseti ulo-ikwūm nākwuli kwa ákwà-nkwubam. 21N'ihi na ndi-ọzùzù-aturu aghọwo anu-ọhia, ma Jehova ka ha nājughi ase: n'ihi nka ha enweghi uche, aturu nile ha nāzù we b͕asa. 22Ge nti olu nke ihe anuru, le, ọ nābia, oké ùzù agha nēsi kwa n'ala Ugwu bia, ime ka obodo nile nke Juda ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe-obibi nke nkita-ọhia. 23Jehova, amawom na ọ bughi n'aka ya onwe-ya ka uzọ madu di: ọ bughi onye ọ bula nke nēje ije nwe ime ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike. 24Dọm aka na nti, Jehova, ma nání n'ikpé; adọlam aka na nti n'iwe-gi, ka I we ghara ibilatam. 25Wukwasi mba nile ọzọ ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi, wukwasi kwa ab͕uru nile ndi nākpọkughi aha-Gi: n'ihi na ha eripiawo Jekob, e, ha eripiawo ya, me ka ọ gwusia, ha emewo kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JEREMAIA 10: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye