Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-IKPE 15

15
1O rue, mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, na mb͕e obìbì ọka wheat, na Samson were nwa-ewu leta nwunye-ya; ọ si, Ka m'bakuru nwunyem n'ime-ulo. Ma nna nwunye-ya ekweghi ka ọ ba. 2Nna-ya we si, Asirim n'ezie na i kpọrọ ya asì nke-uku; m'we nye ya nwoke-ibe-gi: nwa-nne-ya nke-ntà, ọ̀ dighi nma kari ya? biko, ka ọ nọchiri gi n'ọnọdu ya. 3Samson we si ha, Otù ub͕ò a m'gābu onye ikpe nāmaghi kari ndi Filistia, ọ bu ezie na mu onwem nēme ha ihe ọjọ. 4Samson we je nwude ọgu nkita-ọhia iri-na-ise, chiri ọwa, che ọdudù iru, tiye otù ọwa n'etiti ọdudù abua n'ab͕ata ha. 5Ọ we muye ọku n'ọwa nile, zipu ha ga n'ọka guzoro eguzo nke ndi Filistia, we sure ma obo ọka ma ọka guzoro eguzo, ha na ubi-olive. 6Ndi Filistia we si, Ònye meworo nka? Ha si, Samson, di nwa onye Timna, n'ihi na ọ narawo ya nwunye-ya, nye ya nwoke-ibe-ya. Ndi Filistia we rigo, kpọre ya na nna-ya n'ọku. 7Samson we si ha, Ọ buru na unu eme otú a, aghaghm ibọrọ onwem ọ́bọ n'aru unu, ma emesia m'gāgha. 8O we tib͕ue ha ntib͕u uku, ogwe-ukwu n'elu apata-ukwu: ọ we rida, nọdu nime nb͕awa nke nkume di elu, bú Itam.
9Ndi Filistia we rigo, ma ulo-ikwū-ha nime Juda, b͕asa onwe-ha nime Lehi. 10Ndikom Juda we si, N'ìhi gini ka unu rigotaworo megide ayi? Ha si, Ike Samson ab͕u ka ayi rigotaworo, ime ya dika o meworo ayi. 11Nnù ndikom Juda asa na ọgu iri we ridarue nb͕awa nkume di elu, bú Itam, si Samson, Ì maghi na ndi Filistia bu ndi nāchi ayi? gini bu kwa nka i meworo ayi? Ọ si ha, Dika ha merem, otú a ka m'meworo ha. 12Ha si ya, Ike gi ab͕u ka ayi ridataworo, inye gi n'aka ndi Filistia. Samson we si ha, Ṅuaranum iyi, ka unu we ghara idakwasim, unu onwe-unu. 13Ha we gwa ya okwu, si, É-è; kama ayi gēkesi gi ab͕u ike, nye gi n'aka-ha: ma ayi agaghi-eme ka i nwua ma-ọli. Ha we chiri udọ̀ ọhu abua ke ya ab͕u, me ka o si na nkume ahu di elu rigota. 14Mb͕e ya onwe-ya biaruru Lehi, ndi Filistia we tie nkpu n'izute ya: Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, udọ̀ abua nke di n'ogwe-aka-ya abua we di ka flax nke reworo n'ọku, ab͕u-ya nile we b͕azepu n'aka-ya abua. 15O we huta ọkpukpu-àb͕à ọhu nke inyinya-ibu, setipu aka-ya, jide ya, were ya tib͕ue nnù ndikom abua na ọgu iri. 16Samson we si,
Ọkpukpu - àb͕à inyinya - ibu ka m'jiworo, otù obo, obo abua,
Ọkpukpu - àb͕à inyinya - ibu ka m'jiworo tib͕u nnù ndikom abua na ọgu iri.
17O rue, mb͕e o kwubìri okwu, na ọ tupuru ọkpukpu-àb͕à-anu ahu n'aka-ya; o we kpọ ebe ahu Remat-lehi. 18Akpiri we kpọ ya nku nke-uku, o we kpọkue Jehova, si, Gi onwe-gi esiwo n'aka orù-gi nye nzọputa uku a: ma ub͕u a m'gānwu n'akpiri-ikpọ-nku, dabà n'aka nke ndia anēbìghi úgwù. 19Chineke we b͕awa olùlù ahu nke di nime Lehi, miri we si nime ya puta; o we ṅua, mọ-ya we biaghachi, o we di ndu; n'ihi ya ọ kpọrọ aha-ya En-hakore, nke di na Lehi, rue ta. 20Ọ we kpe Israel ikpe na mb͕e ndi Filistia orú arọ.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

NDI-IKPE 15: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara