Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 5

5
1Biko, ka m'bùara onye ihe-ya nātọm utọ nke-uku abù nke onye ihe-ya nātọm utọ bayere ubi-vine-ya. Onye ihe-ya nātọm utọ nke-uku nwere ubi-vine n'ugwu ntà nke bu ezi oké ala: 2o we gwue ya, tutupu nkume-ya nile, kua osisi vine kachasi nma nime ya, wue ulo-elu n'etiti ya, waputa kwa ebe-inara-manya-vine nime ya: o we le anya na ọ gāmi nkpuru-vine, ma ọ miri nkpuru-vine ọhia. 3Ma ub͕u a, unu ndi bi na Jerusalem na ndi Juda, biko, kpenu ikpe n'etiti mu na ubi-vine nkem. 4Gini ka agēme ubi-vine nkem ọzọ, nke m'nēmeghi nime ya? gini mere, mb͕e m'lere anya na ọ gāmi nkpuru-vine, o ji mia nkpuru-vine ọhia? 5Ma ub͕u a, biko, ka m'me ka unu mara ihe mu onwem gaje ime ubi-vine nkem: m'gēwezuga ogige-ya, o we ghọ ebe anu-ulo nāta nri; m'gētipia mb͕idi-ya, o we ghọ ebe anāzọtọ: 6m'gēme kwa ka ọ gwusia; agaghi-akwacha vine-ya, agaghi-edozi kwa ya; ma ogwu na uke gētoputa: igwe-oji nile ka m'gēnye kwa iwu ka ha ghara izokwasi ya miri. 7N'ihi na ubi-vine nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu ulo Israel, ndi Juda bu kwa ihe-ọkukú nātọ Ya utọ nke-uku: O we le anya ikpe ziri ezi, ma, le, nwusi-ọbara; O lere anya ezi omume, ma, le, iti-nkpu.
8Ahuhu gādiri ndi nātukwasi ulo n'ulo, ndi nēme ka ubi rue ubi nso, rue mb͕e ọnọdu adighi kwa ọzọ, ewe me ka nání unu biri n'etiti ala! 9Na ntim abua ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, N'ezie ọtutu ulo gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọbuná ulo uku nke bu kwa ezi ulo, nke ọ nādighi onye ọ bula nēbi nime ha. 10N'ihi na ala ubi-vine nke madu gēji ehi abua alu n'ubọchi iri gēweputa nání otù ihe-ọtùtù bath nke manya-vine, ọzọ, otù ihe-ọtùtù homer nke nkpuru-ọghigha gāmi nání otù ihe-ọtùtù ephah.
11Ahuhu gādiri ndi nēbili n'isi-ututu ib͕aso ihe-ọṅuṅu nābà n'anya; ndi nānọ ogologo mb͕e n'anyasi, manya-vine ewe me ka aru nwuru ha ọku. 12Ubọ-akwara na une na egwú-otiti na ọ̀jà na manya-vine di kwa n'ọṅuṅu-manya-vine-ha nile: ma ha adighi-elegide ọlu Jehova anya, ha ahughi kwa ihe aka-Ya abua nēme. 13N'ihi nka ndim ejewo biri n'ala ọzọ, site n'amaghi-ama: ndi-nsọpuru-ha bu kwa ndi agu nāgub͕u, ìgwè-ha bu kwa ndi akpiri miri nākpọsi nku ike. 14N'ihi nka ala-mọ emewo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara, ọ saghebigawo kwa ọnu-ya ókè: ima-nma Jerusalem, na ìgwè-ya, na nkpọtu-ya, na onye nāṅuri ọṅu-agha n'etiti ya, gārida kwa nime ya. 15Onye di ala we ruda n'ala, onye di elu nēme kwa onwe-ya ka ọ di ala, anēme kwa anya abua nke ndi di elu ka ha di ala: 16ma Jehova nke usu nile nke ndi-agha di elu n'ikpé, edowo kwa Chineke, bú Onye Nsọ ahu, nsọ n'ezi omume. 17Umu-aturu gāta kwa nri dika ọ bu n'ọzara-ha, ndi-ọbìa gērichapu kwa nkpọnkpọ-ebe nile nke ndi ahu mara abuba.
18Ahuhu gādiri ndi chiri udọ̀ ihe-efu adọkpu ajọ omume, ndi ji kwa dika agāsi na ọ bu udọ̀ ub͕ọ-ala adọkpu nmehie: 19ndi nāsi; Ya me ngwa, Ya lua ọlu-Ya ọsọsọ, ka ayi we hu: ka ndum-ọdu nke Onye Nsọ nke Israel bia rue ayi nso bia, ka ayi we mara.
20Ahuhu gādiri ndi nākpọ ihe ọjọ ezi ihe, ndi nākpọ kwa ezi ihe ihe ọjọ; ndi nētiye ọchichiri n'ọnọdu ìhè, na ìhè n'ọnọdu ọchichiri; ndi nētiye ihe ilu n'ọnọdu ihe utọ, na ihe utọ n'ọnọdu ihe ilu!
21Ahuhu gādiri ndi mara ihe n'anya ha onwe-ha, ndi nēle kwa onwe-ha anya na ha bu ndi-nghọta!
22Ahuhu gādiri ndi-dike n'iṅu manya-vine, ndi bu kwa dìnkpà n'itigwa ihe-ọṅuṅu n'anya: 23ndi nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume n'ihi iri-ngo, ha nēwezuga kwa ezi omume nke onye ezi omume n'aru ya! 24N'ihi nka dika ire ọku si erichapu ahihia-ọka, na dika ahihia nke kpọrọ nku si ada n'ọku nēnwu enwu, otú a nkpọrọgwu-ha gādi ka ihe nēre ure, ifuru-ha gāla kwa elu dika uzuzu: n'ihi na ha ajuwo iwu nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu kwa okwu-ọnu nke Onye Nsọ nke Israel ka ha lelìworo.
25N'ihi nka ka iwe Jehova di ọku n'aru ndi-Ya, O we setipu aka-Ya megide ha, tib͕ue ha, ugwu nile we ma jijiji, ozu ndi ahu we di ka ǹsí-anu n'etiti èzí nile. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti. 26O we weliere mba ndi sitere n'ebe di anya ọkọlọtọ, kpọkọta ya òkù site na nsọtu uwa: ma, le, ọ nēme ngwa bia ọsọsọ: 27ọ dighi onye nāda #mbà, ọ dighi kwa onye nāsu ngọngọ, n'etiti mba ahu; ọ dighi onye nātu òrù-ura, ọ dighi kwa onye nāraru ura; agaghi-atọpu kwa ihe-ọkiké úkwù-ha, agaghi-etibi kwa eriri akpukpọ-ukwu-ha abua: 28ndi àkú-ha nile di nkọ, uta-ha nile ka azọrọ ukwu ikwe ha; aguwo ukwu inyinya-ha nile dika ọmu, na wheel-ha nile dika oké ifufe: 29uja ha nāb͕ọ di ka nke nne-ọdum, ha nāb͕ọ uja dika umu-ọdum; e, ha nēbib͕ọ, jide anu-ndọb͕u, buru ya la, ma onye-nnaputa adighi. 30Ha gēbib͕ọ kwa megide ya n'ubọchi ahu dika nbib͕ọ nke oké osimiri: asi kwa na madu elegide ala anya, le, ọchichiri di; nkpà na ìhè; ọ b͕awo ọchichiri n'igwe-oji-ya nile.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

AISAIA 5: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye