Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 15

15
1Ibu ebero Moab.
N'ihi na n'otù abali ka ebibiworo Ai nke Moab, me ka ọ la n'iyì; n'ihi na n'otù abali ka ebibiworo Kia nke Moab, me ka ọ la n'iyì. 2Ọ rigowo n'ulo, ọbuná Dibon, n'ebe-ya di elu, ikwa ákwá: n'aru Nebo na n'aru Medeba ka Moab nākwasi ákwá ike: n'isi-ha nile ka nkwọcha-isi di, afu-ọnu nile ọ bula ka ebipuworo. 3N'èzí-ya nile ka ha keworo ákwà-nkpe: n'elu ulo-ya nile na n'amá-ya nile ka onye ọ bula nākwasi ákwá ike, nākwab͕u onwe-ya. 4Heshbon nēti kwa nkpu, ya na Eleale: rue Jehaz ka anānu olu-ha: n'ihi nka ndi ejikere ibu agha nke Moab nētisi nkpu ike; nkpuru-obi-ya nāma jijiji nime ya. 5Obim nētiri Moab nkpu; ndi-ọ̀sọ́-ya, nāb͕a ọsọ rue Zoa, rue Eglat-shelishiya: n'ihi na nrigo Luhit, o ji ikwa-ákwá arigo na ya; n'ihi na n'uzọ Horonaim ka ha nētisi nkpu ntikpọ ike. 6N'ihi na miri Nimrim gābu nání ebe tọb͕ọrọ n'efu: n'ihi na ahihia akpọnwuwo, ahihia ndu agwusiwo, akwukwọ ndu adighi. 7N'ihi nka ihe o nwebigara ókè nke o nwetara, na ihe ha kpakọbaworo, n'ofè iyi osisi willow ka ha gēbulaga ha. 8N'ihi na iti-nkpu adazuwo udà n'ókè-ala Moab buruburu; n'Eglaim ka ákwá ọ nākwasi ike daruworo, ọ bu kwa na Bia-ilim ka ákwá ọ nākwasi ike daruworo. 9N'ihi na miri Dimon juputara n'ọbara: n'ihi na M'gātukwasi kwa n'aru Dimon ihe ọzọ, ndi Moab nke b͕apuru ab͕apu ka M'gātukwasiri ọdum, tukwasi-kwa-ra ndi ala-ha fọduru.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

AISAIA 15: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye