Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

HOSEA 10

10
1Osisi vine nke nēkosa ekosa ka Israel bu, nkpuru ka ọ nāmiziri onwe-ya: ọ bu dika iba-uba nke nkpuru-ya si di ka o mere ka ebe-ichu-àjà-ya ba uba; ọ bu dika ọdi-nma nke diri ala-ya si di ka ha mere ka ogidi nile di nma. 2O kesawo obi-ha; ub͕u a ka ikpe gāma ha: Ya onwe-ya gētipia ebe-ichu-àjà nile ha, bibie ogidi nile ha. 3N'ezie ub͕u a ka ha gāsi, Ọ dighi eze ayi nwere: n'ihi na ayi atughi egwu Jehova; ma eze, gini ka ọ gēmere ayi? 4Ha ekwuwo okwu efu di iche iche, ha nāb͕a iyi ugha, ha nāb͕a ndu: ikpe ewe pulite dika hemlok nime ọ̀b͕à ubi. 5Ọ bu bayere umu-ehi nke Bet-even ka ndi bi na Sameria gātu ujọ: n'ihi na ndi-ya gēruru ya újú, ha na ndi-nchu-àjà-ya ndi nētere ya-ri egwú ọṅù, n'ihi nsọpuru-ya, n'ihi na o siwo n'ebe ọ nọ je biri n'ala ọzọ. 6Ọ bu kwa ihe ahu ka agēduga n'Asiria, ibu onyinye-inata-iru-ọma agēnye eze, bú Jereb: ihere ka Efraim gānata, ihere ndum-ọdu-ya gēme kwa Israel. 7Emewo ka Sameria la n'iyì, ya na eze-ya, dika irighiri-osisi n'elu miri. 8Agēkpochapu kwa ebe nile di elu nke Even, bú nmehie Israel: ogwu na uke gēpulite n'ebe-ichu-àjà nile ha; ha gāsi kwa ugwu nile, Kpuchienu ayi; ha gāsi kwa ugwu ntà nile, Dakwasinu ayi. 9Site n'ubọchi Gibea ka i mehieworo, gi Israel: n'ebe ahu ka ha guzoro; ka agha anēbuso umu ajọ omume we ghara irute ha nime Gibea. 10Mb͕e M'chọrọ, M'gādọ ha aka na nti; agāchikọta kwa ndi nile di iche iche imegide ha, mb͕e agēke ha ab͕u n'ajọ omume-ha abua. 11Efraim bu kwa nwa-ab͕ọghọ-ehi nke emeworo ka ọ muta ihe, nke nāhu izọcha ọka n'anya; ma Mu onwem agabigawo n'elu olu-ya di nma: M'gēme ka anọkwasi Efraim dika inyinya; Juda gādọ ihe eji gwu ala-ubi, Jekob gētipiara ya ájá. 12Gharanu onwe-unu nkpuru n'ezi omume, wenu ihe-ubi dika ebere si di; lucharanu onwe-unu ubi: n'ihi na ọ bu mb͕e ichọ Jehova, rue mb͕e Ọ gābia, zokwasi unu ezi omume dika miri. 13Unu aluwo nmebi-iwu dika ubi, ajọ omume ka unu weworo dika ihe-ubi; unu eriwo nkpuru okwu-ugha: n'ihi na i tukwasiri uzọ-gi obi, n'iba-uba nke ndi-dike-gi. 14Nkpọtu gēbili kwa n'etiti umu-nna-gi, ọ bu kwa ebe-gi nile ewusiri ike ka agēbibi, dika Shalman bibiri Bet-abel n'ubọchi agha: nne n'elu umu-ya ka atupiara. 15Otú a ka Bet-el gēme unu n'ihi ihe ọjọ unu nke kachasi ihe ọjọ nile: na chi-ọbubọ ka agēme ka eze Israel lasia n'iyì.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

HOSEA 10: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye