Ya mere ka ayi onwe-ayi, ebe ayi nwere oké ìgwè ndi-àmà di otú a ndi b͕ara ayi gburugburu dika igwe-oji, ka ayi tupu kwa ibu nile ọ bula, ya na nmehie ahu nke nārapara ayi n'aru nke-uku, ka ayi were kwa ntachi-obi b͕a ọsọ ahu edebere ayi n'iru, nēlegide Jisus anya, bú onye-ndú na onye-nmezu nke okwukwe-ayi, Onye n'ihi ọṅù edebere n'iru Ya nātachi obi n'obe-Ya, nēlelì ihere anya, O we nọdu n'aka-nri nke oche-eze Chineke. na n'ihi ya, tugharianu uche n'Onye ahu Nke tachiworo obi na nkwugide di otú a, bú nke ndi-nmehie nēkwugide onwe-ha, ka ike ghara igwu unu, unu we da #mbà na nkpuru-obi-unu. Unu akēguzogideghi rue ọbara, n'ib͕a nb͕a megide nmehie: unu echezọsiwo kwa okwu nkasi-obi ahu, nke nāgwa unu okwu dika anāgwa umu-ndikom, si,
Nwam, agula ya n'ihe ntà, bú ozizí Onye-nwe-ayi nēzí gi site n'inye gi ahuhu,
Ada-kwa-la #mbà mb͕e Ọ nātu gi nmehie-gi n'anya;
N'ihi na onye Onye-nwe-ayi huru n'anya ka Ọ nēzí ihe site n'inye ya ahuhu,
O nāpia kwa nwa ọ bula Ọ nānata utari.
Nātachinu obi ka ewe zí unu ihe site n'inye unu ahuhu; n'ihi na Chineke nēmeso unu dika umu; n'ihi na ònye bu nwa ahu nna-ya nādighi-ezi ya ihe site n'inye ya ahuhu? Ma ọ buru na adighi-ezí unu ihe site n'inye unu ahuhu, nke emeworo unu niile ka ha buru ndi-nketa, ya mere unu bu umu iko, unu abughi kwa umu n'ezie. Ọzọ kwa, ayi nwere ndi bu nna nke anu-aru-ayi izí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu, ayi we sọpuru ha: àyi agaghi-edo kari onwe-ayi nke-uku n'okpuru Nna nke mọ-ayi, we di ndu? N'ihi na ndi ahu nezí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu n'ezie ubọchi ole-na-ole otú ọ di ha nma; ma Ya onwe-ya nēzí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu ka o we bara ayi urù, ka ayi we keta idi-nsọ-Ya. Ozizí nile site n'inye ahuhu nādi ka ihe nādighi-eweta ọṅù n'oge di ub͕u a, kama nwuta: ma emesia ọ nēnyeghachi ndi ahu ewereworo ya nwaputa ha nkpuru nke di n'udo, bú nkpuru nke ezi omume. N'ihi nka menu aka nēruda eruda na ikperè nwuworo anwu ka ha guzozie: kwa-kwa-ranu ukwu-unu uzọ nke nēguzozi ọtọ, ka ewe ghara ime ka ukwu nke di ngwurọ kwopu, kama ka ewe me ka ọ di ike.
Nāb͕asonu udo n'ebe madu nile nọ, ya na ido-nsọ ahu, nke onye ọ bula agaghi-ahu Onye-nwe-ayi anya ma o nweghi ya: nēle-kwa-nu anya nke-ọma, ma ọ di onye ọ bula nke nērughi amara Chineke; ka nkpọrọgwụ ilu obula we ghara ipuputa we sob͕ue unu; ewe were nkpọrọgwụ ahu meru ọra madu; ma ọ di onye ọ bula nke nākwa iko, ma-ọbu nke emeruru emeru, dika Isọ, onye rere di-ọkpara ya onwe-ya bu n'ọnọdu otù oriri. N'ihi na unu matara na ọbuná mb͕e ọ chọrọ iketa ngọzi ahu mb͕e emesiri, ajuru ya (n'ihi na ọ hughi ọnọdu nke nchèghari), ọ bu ezie na o were anya-miri chọsie ya ike.
N'ihi na unu abiarughi ọku nke apuru idatu ya aka na nke afunwuworo, na itiri, na ọchichiri, na oké ifufe, na udà opì, na olu okwu; nke ndi nuru ya riọrọ ka aghara itukwasiri ha okwu ọ bula ọzọ: n'ihi na ha anānagideghi ihe enyere n'iwu, bú, Asi na ọbuná anu-ulo emetu ugwu ahu, agēwere nkume tub͕ue ya; ka ihe ahu anēkiri si di kwa egwu nke-uku, Moses siri, Anamatu oké egwu, aru ma-kwa-ram jijiji: kama unu abiaruwo ugwu Zaion, na obodo nke Chineke di ndu, bú Jerusalem nke di n'elu-igwe, na ọtutu ndi anāpughi iguta ọnu