Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-HIBRU 10:5-18

NDI-HIBRU 10:5-18 IGBOB

N'ihi nka mb͕e Ọ nābia n'uwa, Ọ si, Àjà na ihe echere n'iru Gi, I chọghi ha, Ma aru ka I kwadebere nyem; Àjà-nsuresi-ọku na àjà achuru bayere nmehie, ha abughi ihe di Gi ezi nma: Mb͕e ahu ka M'siri, Le, abiawom (N'akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem) Ime ihe I nācho, Chineke. Mb͕e O buru uzọ kwu, si, Àjà na ihe echere n'iru Gi na àjà-nsuresi-ọku na àjà achuru bayere nmehie, I chọghi ha, ha abughi kwa ihe di Gi ezi nma (bú ihe anēche n'iru Chineke dika iwu si di), mb͕e ahu ka Ọ siworo, Le, abiawom ime ihe I nāchọ. Ọ nēwepu nke-mbu, ka O we me ka nke-abua guzo. Ọ bu kwa n'ọchichọ a ka edoworo ayi nsọ site n'iche aru Jisus Kraist n'iru Chineke dika àjà nání otù mb͕e. Onye-nchu-àjà ọ bula nēguzo kwa kwa-ubọchi nēfè òfùfè nēche kwa otù àjà ndia n'iru Chineke ọtutu mb͕e, bú àjà nke nāpughi ihichapu nmehie mb͕e ọ bula: ma Onye ahu, mb͕e O chereri otù àjà n'iru Chineke n'ihi nmehie, O we nọdu n'aka-nri Chineke mb͕e nile; nēle anya n'oge fọduru rue mb͕e agēdo ndi-iro-Ya dika ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Ya abua. N'ihi na O sitewo n'iche Onwe-ya n'iru Chineke dika àjà otù mb͕e me ka ndi anēdo nsọ zue okè mb͕e nile. Mọ Nsọ nāb͕a-kwa-ra ayi àmà: n'ihi na mb͕e O kwuru, si, Nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ha gāb͕a Mb͕e ubọchi ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru; M'gētiye iwum n'obi-ha, Ọ bu kwa n'uche-ha ka M'gēdekwasi ha dika n'akwukwọ; mb͕e ahu Ọ si, M'gaghi-echeta kwa nmehie nile ha na nmebi-iwu nile ha ọzọ ma-ọli. Ma ebe nb͕aghara ihe ndia di, iche àjà n'iru Chineke bayere nmehie adighi ọzọ.