Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-HIBRU 10:5-18

NDI-HIBRU 10:5-18 Bible Nso (IGBOB)

N'ihi nka mb͕e Ọ nābia n'uwa, Ọ si, Àjà na ihe echere n'iru Gi, I chọghi ha, Ma aru ka I kwadebere nyem; Àjà-nsuresi-ọku na àjà achuru bayere nmehie, ha abughi ihe di Gi ezi nma: Mb͕e ahu ka M'siri, Le, abiawom (N'akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem) Ime ihe I nācho, Chineke. Mb͕e O buru uzọ kwu, si, Àjà na ihe echere n'iru Gi na àjà-nsuresi-ọku na àjà achuru bayere nmehie, I chọghi ha, ha abughi kwa ihe di Gi ezi nma (bú ihe anēche n'iru Chineke dika iwu si di), mb͕e ahu ka Ọ siworo, Le, abiawom ime ihe I nāchọ. Ọ nēwepu nke-mbu, ka O we me ka nke-abua guzo. Ọ bu kwa n'ọchichọ a ka edoworo ayi nsọ site n'iche aru Jisus Kraist n'iru Chineke dika àjà nání otù mb͕e. Onye-nchu-àjà ọ bula nēguzo kwa kwa-ubọchi nēfè òfùfè nēche kwa otù àjà ndia n'iru Chineke ọtutu mb͕e, bú àjà nke nāpughi ihichapu nmehie mb͕e ọ bula: ma Onye ahu, mb͕e O chereri otù àjà n'iru Chineke n'ihi nmehie, O we nọdu n'aka-nri Chineke mb͕e nile; nēle anya n'oge fọduru rue mb͕e agēdo ndi-iro-Ya dika ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Ya abua. N'ihi na O sitewo n'iche Onwe-ya n'iru Chineke dika àjà otù mb͕e me ka ndi anēdo nsọ zue okè mb͕e nile. Mọ Nsọ nāb͕a-kwa-ra ayi àmà: n'ihi na mb͕e O kwuru, si, Nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ha gāb͕a Mb͕e ubọchi ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru; M'gētiye iwum n'obi-ha, Ọ bu kwa n'uche-ha ka M'gēdekwasi ha dika n'akwukwọ; mb͕e ahu Ọ si, M'gaghi-echeta kwa nmehie nile ha na nmebi-iwu nile ha ọzọ ma-ọli. Ma ebe nb͕aghara ihe ndia di, iche àjà n'iru Chineke bayere nmehie adighi ọzọ.

NDI-HIBRU 10:5-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ya mere mgbe Kraịst bịara nʼụwa, ọ sịrị, “Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ kama ị kwadoro ahụ nye m. Aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie, ha abụghị ihe dị ezi mma nye gị. Mgbe ahụ ka m sịrị, ‘Lee, abịala m Chineke m, ime ihe ị na-achọ. Nke a bụkwa ihe e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.’ ” O kwuru na mbụ, “Aja dị iche iche, na onyinye, na aja nsure ọkụ na aja mmehie adịghị atọ gị ụtọ, ha adịghịkwa amasị gị” (a chụrụ aja ndị a dịka iwu si dị). O kwukwara ọzọ, “Lee abịala m ime uche gị.” Ọ kagburu aja nke mbụ ahụ ma were aja nke abụọ dochie nʼọnọdụ ya. Site nʼime uche Chineke, e mere ka anyị dị nsọ site nʼaja Jisọs Kraịst ji onwe ya chụọ naanị otu ugboro. Onye nchụaja ọbụla na-eguzo kwa ụbọchị na-efe ofufe, na-achụkwa otu aja ahụ ugboro ugboro, bụ aja nke na-enweghị ike ịsachapụ mmehie. Ma mgbe Kraịst chụchara naanị otu aja ahụ, otu ugboro nʼihi mmehie niile, ọ nọdụrụ ala nʼaka nri Chineke. Ebe ahụ ka ọ nọ ugbu a na-eche ka ndị iro ya niile bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ ya. Nʼihi na o sitela nʼotu aja mee ka ndị ahụ a na-eme ka ha dịrị nsọ zuo oke mgbe niile. Mmụọ nsọ na-agbakwara anyị ama banyere ihe ndị a mgbe o buru ụzọ kwuo: “Nke a bụ ọgbụgba ndụ ahụ mụ na ha ga-agba mgbe oge ndị ahụ gasịrị, ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m etinye iwu m nʼobi ha. Aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.” O kwukwara sị, “Agaghị m echetakwa mmehie ha na mmebi iwu ha niile ọzọ.” Ya mere, ebe ọ bụ na a gbagharala mmehie ndị a, ọ dịkwaghị mkpa ịchụ ajọ ọzọ maka mgbaghara mmehie.