Ya mere, umu-nnam, ebe ayi nwere nkwuwa-okwu ibà n'ebe nsọ ahu site n'ọbara Jisus, bú uzọ O mere ọhu nye ayi, nke di ọhu di kwa ndu, site n'ákwà-nb͕ochi, nke ahu bu, anu-aru-Ya; ebe ayi nwe-kwa-ra Onye-nchu-àjà uku edoro onye-isi èzí-na-ulo Chineke; ka ayi were obi ezi-okwu biarue nso nime nkwezu nke okwukwe, buru kwa ndi efesaworo ọbara n'obi-ayi pua n'ajọ akọ-na-uche, ndi asachawo-kwa-ra aru-ayi na miri di ọcha: ka ayi jidesie nkwuputa nke olile-anya-ayi ike ka ọ ghara iruda n'ala; n'ihi na Onye ahu Nke kwere nkwa kwesiri ntukwasi-obi: ka ayi nātugharita kwa uche n'aru ibe-ayi ikpasu ihu-n'anya na ọlu ọma di iche iche; ka ayi ghara kwa irapu nzukọ nke onwe-ayi, dika ufọdu nēme, kama ka ayi nādusi ndi ọzọ ọdu ike; ka ayi me kari kwa otú a, n'uzọ ra otú unu nēle ubọchi ahu anya ka ọ nābiaru nso.
N'ihi na asi na ayi were ọchichọ-obi nānọ na nmehie mb͕e ayi nataworo nmazu nke ezi-okwu, àjà agāchu bayere nmehie di iche iche afọdughi ọzọ, kama nke fọduru bu oké olile-anya di egwu nke ikpé, ya na ọku nēre ike ike nke gaje iripia ndi nēguzogide Chineke. Onye ọ bula nke juworo iwu Moses gānwu anwu nēmereghi ya ebere n'okwu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ: ma àhuhu ahu jọkariri njọ ra aṅa, bú nke agāgu na onye ahu kwesiri ka enye ya, ka unu chère, bú onye nke zọworo Ọkpara Chineke ukwu, onye guwo-kwa-ra ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú nke eji do ya nsọ, n'ihe emeruru emeru, onye mewo-kwa-ra Mọ nke amara ihe-ihere? N'ihi na ayi matara Onye ahu Nke siri, Mu nwe ọ́bọ̀, Mu onwem gēnyeghachi. Ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi gēkpe ndi-Ya ikpé. Ọ bu ihe di egwu idabà n'aka Chineke di ndu.
Ma nēchetanu ubọchi mbu ahu, nke ọ bu nime ha, mb͕e enyesiri unu ìhè, ka unu tachiri obi n'oké ib͕a-nb͕a nke ahuhu di iche iche; n'otù akuku, ebe ewere ita-uta na nkpab͕u di iche iche me unu ka unu buru ihe-nkiri; n'akuku ọzọ, ebe unu ghọrọ ndi nēso ndi nēbi obi otú a nwekọ ahuhu. N'ihi na unu ji obi so ndi nọ n'ab͕u hukọ ahuhu, unu were kwa ọṅù nara npunara ahu nke-ọma, bú nke apunara unu ihe nile unu nwere, ebe unu mara na unu nwere onwe-unu dika ihe unu nwere, bú ihe ka nma nke nādigide kwa. Ya mere unu etufula nkwuwa-okwu-unu, bú ihe nke nwere oké nnyeghachi nke ugwọ-ọlu. N'ihi na ntachi-obi di unu nkpà, ka ọ gābu, mb͕e unu meworo ihe Chineke nāchọ, ka unu we nata nkwa ahu.
N'ihi na le ka nwa oge ntà fọduru ra,
Onye ahu Nke nābia gābia, Ọ gaghi-anọ kwa ọdù.
Ma onye ezi omume nkem gēsite n'okwukwe di ndu:
Ọ buru kwa na ọ gēwezuga onwe-ya, ihe-ya adighi nkpuru-obim ezi nma.
Ma ayi onwe-ayi adighi n'etiti ndi wezugara onwe-ha ila n'iyì; kama ayi di n'etiti ndi kwere ekwe inweta nkpuru-obi-ha.