ebe emere Ya-ri ka Ọ ka ndi-mọ-ozi nma n'uzọ ra otú O ketawa aha nke ka nma. N'ihi na ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka Ọ siri mb͕e ọ bula,
Ọkparam ka Gi onwe-gi bu,
Mu onwem amuwo Gi ta?
ọzọ kwa,
Mu onwem gāburu Ya Nna,
Ya onwe-ya gābu-kwa-ram Ọkpara?
Ma ọzọ kwa, mb͕e ọ bula Ọ gākpọbatawori Ọkpara ahu n'elu-uwa ebe madu bi, Ọ si, Ka ndi-mọ-ozi nile nke Chineke kpọ kwa isi ala nye Ya. Ọ nēkwu kwa ihe bayere ndi-mọ-ozi, si,
Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe,
Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu:
ma Ọ nēkwu ihe bayere Ọkpara ahu, si,
Oche-eze-gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi;
Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka nke ala-eze-Gi bu kwa.
I huru ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì;
N'ihi nka Chineke, bú Chineke-Gi, tere Gi
Manu obi-utọ n'isi kari ndi-nketa-ibe-Gi.
Ọzọ kwa,
Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, na mbu ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa;
Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa:
Ha onwe-ha gāla n'iyì; ma Gi onwe-gi nānọgide:
Ha nile gāka kwa nká dika uwe;
Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāpiakọta kwa ha,
Dika uwe, agāb͕anwe kwa ha:
Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile,
Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu.
Ma ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka O kwuworo okwu bayere ya mb͕e ọ bula, si,
Nọdu ala n'aka-nrim,
Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi ukwu-Gi abua?
Hà nile abughi ndi-mọ nēfè òfùfè, ndi eziputara ije ozi n'ihi ndi gaje iketa nzọputa?