Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-HIBRU 1:4-14

NDI-HIBRU 1:4-14 IGBOB

ebe emere Ya-ri ka Ọ ka ndi-mọ-ozi nma n'uzọ ra otú O ketawa aha nke ka nma. N'ihi na ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka Ọ siri mb͕e ọ bula, Ọkparam ka Gi onwe-gi bu, Mu onwem amuwo Gi ta? ọzọ kwa, Mu onwem gāburu Ya Nna, Ya onwe-ya gābu-kwa-ram Ọkpara? Ma ọzọ kwa, mb͕e ọ bula Ọ gākpọbatawori Ọkpara ahu n'elu-uwa ebe madu bi, Ọ si, Ka ndi-mọ-ozi nile nke Chineke kpọ kwa isi ala nye Ya. Ọ nēkwu kwa ihe bayere ndi-mọ-ozi, si, Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe, Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu: ma Ọ nēkwu ihe bayere Ọkpara ahu, si, Oche-eze-gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi; Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka nke ala-eze-Gi bu kwa. I huru ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì; N'ihi nka Chineke, bú Chineke-Gi, tere Gi Manu obi-utọ n'isi kari ndi-nketa-ibe-Gi. Ọzọ kwa, Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, na mbu ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa; Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa: Ha onwe-ha gāla n'iyì; ma Gi onwe-gi nānọgide: Ha nile gāka kwa nká dika uwe; Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāpiakọta kwa ha, Dika uwe, agāb͕anwe kwa ha: Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile, Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu. Ma ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka O kwuworo okwu bayere ya mb͕e ọ bula, si, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi ukwu-Gi abua? Hà nile abughi ndi-mọ nēfè òfùfè, ndi eziputara ije ozi n'ihi ndi gaje iketa nzọputa?