Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 50

50
1Josef we dakwasi n'iru nna-ya, kwakwasi ya ákwá, sutu kwa ya ọnu. 2Josef we nye ndi-orù-ya, bú ndi-dibia, iwu ib͕asì ozu nna-ya; ndi-dibia ahu we b͕asì ozu Israel. 3Ewe debezuere ya ọgu ubọchi abua: n'ihi na otú a ka anēdebezu ubọchi ndi anāb͕asì ozu-ha: ndi Ijipt we kwara ya ákwá ọgu ubọchi atọ na iri.
4Ubọchi ikwara ya ákwá we gabiga, Josef we gwa ulo Fero okwu, si, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru unu, biko, kwuenu na nti Fero, si. 5Nnam merem ka m'ṅua iyi, si, Le, mu onwem gaje inwu: n'ílìm nke m'doziworo onwem n'ala Kenean, n'ebe ahu ka i gēlìm. Ma ugbua, biko, ka m'rigo, lìe nnam, lata. 6Fero we si, Rigo, lìe nna-gi, otú o mere gi ka i ṅua iyi. 7Josef we rigo ilì nna-ya: ndi-orù Fero nile, na ndi-okenye ulo-ya, na ndi-okenye nile nke ala Ijipt, 8na ulo Josef nile, na umu-nne-ya, na ulo nna-ya, we so ya rigo: nání umu-ntakiri-ha, na ìgwè ewu na aturu-ha, na ìgwè ehi-ha, ka ha rapuru n'ala Goshen. 9Ma ub͕o-ala ma ndi inyinya nēbu we so ya rigo: ọmuma-ulo-ikwū ahu we di oké uku. 10Ha biarue ebe-nzọcha-ọka nke Atad, nke di n'ofè Jọdan, ha we were iti-aka-n'obi di uku di kwa ike nke-uku ti aka n'obi n'ebe ahu: ọ we mere nna-ya oruru-újú ubọchi asa. 11Ndi bi n'ala ahu, bú ndi Kenean, we hu oruru-újú ahu n'ebe-nzọcha-ọka nke Atad, ha si, Nka buru ndi Ijipt oruru-újú di arọ́: n'ihi nka akpọrọ aha-ya Ebel-Mizraim, nke di n'ofè Jọdan. 12Umu-ya ndikom we mere ya otú a dika ọ nyere ha iwu: 13umu-ya ndikom we bubata ya n'ala Kenean, lìe ya n'ọb͕a nke ọhia Makpila, nke Abraham zutara, ya na ọhia, ka ọ buru ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì, n'aka Efron onye-Het, n'iru Mamre.
14Josef we laghachi n'Ijipt, ya onwe-ya, na umu-nne-ya, na ndi nile soro ya rigo ilì nna-ya, mb͕e o lìsiri nna-ya. 15Ma mb͕e umu-nne Josef huru na nna-ha anwuruwo, ha si, Eleghi anya Josef gākpọ ayi asì, ọ gēnyeghachi kwa ayi n'ùjú ihe ọjọ nile ayi mere ya. 16Ha we nye otù onye iwu n'ebe Josef nọ, si, Nna-gi nyere iwu tutu ọnwu-ya, si, 17Otú a ka unu gāsi Josef, Ariọm i, biko, b͕aghara njehie umu-nne-gi, na nmehie-ha, n'ihi na ọ bu ihe ọjọ ka ha meworo gi: ub͕u a kwa, biko, b͕aghara njehie ndi-orù Chineke nke nna-gi. Josef we kwa ákwá mb͕e ha gwara ya okwu. 18Umu-nne-ya we je kwa, da n'ala n'iru ya, si, Le, ayi gāburu gi ndi-orù. 19Josef we si ha, Unu atula egwu: n'ihi na ọ̀ bu n'ọnọdu Chineke ka m'nọ? 20Unu onwe-unu kwa, unu chere ihe ọjọ megidem; Chineke chere ya ka ọ buru ezi ihe, ime dika ọ di ta, idebe ọtutu ndi ndu. 21Ma ub͕u a unu atula egwu: mu onwem ganāzù unu na umu-ntakiri-unu. Ọ we kasie ha obi, gwa ha okwu nāba ha n'obi.
22Josef we biri n'Ijipt, ya onwe-ya, na ulo nna-ya. Josef we di ndu ọgu arọ ise na iri. 23Josef we hu umu Efraim nke umu-umu nke-atọ: amu-kwa-ra umu Makia nwa Manase n'ikperè abua nke Josef. 24Josef we si umu-nne-ya, Mu onwem gaje inwu: ma Chineke gēleta unu n'ezie, me ka unu si n'ala nka rigorue ala ahu nke Ọ ṅuru Abraham na Aisak iyi bayere ya. 25Josef we me ka umu Israel ṅua iyi, si, Chineke gēleta unu n'ezie, unu gēsi kwa n'ebe a bugo ọkpukpum. 26Josef we nwua, ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri: ha we b͕asì ozu-ya etiye ya n'ib͕e n'Ijipt.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JENESIS 50: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye