O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na otù onye siri Josef, Le, nna-gi nāria ọria: o we chiri umu-ya ndikom abua ka ha so ya je, bú Manase na Efraim. Otù onye we gosi Jekob, si, Le, nwa-gi Josef nābiakute gi: Israel we jisie ike, nọdu n'elu ihe-ndina-ya. Jekob we si Josef, Chineke Nke puru ime ihe nile mere ka m'hu Ya anya na Luz n'ala Kenean, Ọ gọziem, sim, Le, M'nēme gi ka i mua ọmùmù, M'gēme kwa gi ka i ba uba, M'gēme kwa gi ka i ghọ nkpọkọta ndi di iche iche; M'gēnye kwa nkpuru-gi gānọchi gi ala nka, ka ọ buru ihe-onwunwe ebighi-ebi. Ma ub͕u a umu-gi ndikom abua, ndi amuru nye gi n'ala Ijipt tutu mu abiakute gi n'Ijipt, nkem ka ha bu; Efraim na Manase, dika Reuben na Simeon, gābu ndi m'nwere. Ma umu-gi, ndi i musoworo ha, ọ bu gi nwe ha; n'aha umu-nne-ha ka agākpọ ha n'ihe-nketa-ha.
Gụọ JENESIS 48
Geere nke a ntị JENESIS 48
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JENESIS 48:1-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị