Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 44

44
1Ọ we nye onye bu onye-isi ulo-ya iwu, si, Kpojue akpa ndikom ahu n'ihe-oriri, otú ha puru ibu, tinye kwa ego onye ọ bula n'ọnu akpa-ya. 2Tiye kwa ọkwam, bú ọkwa ọla-ọcha, n'ọnu akpa onye nke-ntà, ya na ego ọka-ya. Ọ we me dika okwu Josef si di, nke o kwuru. 3Mb͕e ìhè ututu putara, ewe zilaga ndikom ahu, ha na inyinya-ibu-ha. 4Ndi ahu siri n'obodo pua, ha erughi n'ebe di anya, ma Josef siri onye bu onye-isi ulo-ya, Bilie, chua ndikom ahu; mb͕e i ruru ha aru i gāsi ha, N'ìhi gini ka unu were ihe ọjọ kwughachi n'ọnọdu ezi ihe? 5Ọ̀ bughi nka bu ihe onye-nwem ji aṅu ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya ji kwa ya ariba ama n'ezie? unu emewo ihe ọjọ n'ihe nke unu mere. 6Ọ we rue ha aru, gwa ha okwu ndia. 7Ha si ya, N'ìhi gini ka onye-nwem nēkwu okwu dika okwu ndia? Ya buru ndi-orú-gi ihe-árú ime ihe dika ihe a. 8Le, ego nke ayi hutara n'ọnu akpa-ayi, ayi si n'ala Kenean weghachiri gi ya: àyi gēsi kwa aṅa si n'ulo onye-nwe-gi zuru ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo? 9Onye ọ bula n'etiti ndi-orù-gi agāchọta ya n'aka-ya, ya nwua, ọzọ kwa, ayi onwe-ayi gāghọrọ onye-nwem ndi-orù. 10Ọ si, Ub͕u a kwa, dika okwu nile unu si di, otú a ka ọ gādi: onye agāchọta ya n'aka-ya gāburum orù; ma unu onwe-unu gābu ndi puru ya. 11Ha we me ngwa, weda akpa-ha, onye ọ bula akpa nke ya, ha meghe akpa-ha, onye ọ bula akpa nke ya. 12Ọ we chọsie ike, n'okenye ka ọ malitere, ọ bu kwa na nke-ntà ka ọ chọbiri: ewe chọta ọkwa ahu n'akpa Benjamin. 13Ha we dọwa uwe-nb͕okwasi-ha, onye ọ bula o bo inyinya-ibu-ya ibu, ha we laghachi n'obodo. 14Juda na umu-nne-ya we ba n'ulo Josef; ma ya onwe-ya nọ kwa n'ebe ahu rue mb͕e ahu: ha we da n'ala n'iru ya. 15Josef we si ha, Òmume gini bu nka nke unu meworo? ùnu amaghi na nwoke nke di kam nāriba ama n'ezie? 16Juda we si, Gini ka ayi gāsi onye-nwem? gini ka ayi gēkwu? àyi gēsi kwa aṅa gu onwe-ayi na ndi ezi omume? Chineke achọputawo ajọ omume ndi-orù-gi: le, ayi aghọworo onye-nwem ndi-orù, ma ayi onwe-ayi ma onye ahu nke achọta-woro ọkwa ahu n'aka-ya. 17Ọ si, Ya burum ihe-árú ime nka: nwoke ahu achọtaworo ọkwa ahu n'aka-ya, ọnye ahu gāghọrọm orù; ma unu onwe-unu, rigo-kurunu nna-unu n'udo.
18Juda we biakute ya nso, si, Biko, onye-nwe m, biko, ka orù-gi kwue okwu na nti onye-nwe m, iwe-gi adi-kwa-la ọku n'aru orù-gi: n'ihi na otú i di, otú ahu ka Fero di kwa. 19Onye-nwem juru ndi-orù-ya, si, Ùnu nwere nna ma-ọbu nwa-nne? 20Ayi we si onye-nwem, Ayi nwere nna, bú agadi, na otù nwa agadi-ya, bú onye ntà; nwa-nne-ya anwuruwo kwa, ọ we fọdu nwata ahu nání ya nye nne-ya, nna-ya hukwara ya n'anya. 21I we si ndi-orù-gi, Me ka ọ ridakutem, ka m'we tukwasi anyam n'aru ya. 22Ayi we si onye-nwem, Nwa-okoro ahu apughi irapu nna-ya: asi kwa na ọ rapu nna-ya, nna-ya gānwu. 23I we si ndi-orù-gi, Ọ buru na nwa-nne-unu nke-ntà esoghi unu ridata, unu agaghi-ahu irum ọzọ ma-ọli. 24O rue, mb͕e ayi rigokuru orù-gi, bú nnam, na ayi gosiri ya okwu nile nke onye-nwem. 25Nna-ayi we si, Jeghachinu, zutara ayi nwantī ihe-oriri. 26Ayi we si, Ayi apughi irida: ọ buru na nwa-nne-ayi nke-ntà eso ayi je, ayi gārida kwa; n'ihi na ayi apughi ihu iru nwoke ahu, ma ọ buru na nwa-nne-ayi nke-ntà esoghi ayi je. 27Orù-gi, bú nnam, we si ayi, Unu onwe-unu mara na umu-ndikom abua ka nwunyem muru nyem: 28otù nime ha we si n'ebe m'nọ pua, m'we si, N'ezie anu-ọhia adọb͕usiwo ya; ahughi-kwam ya rue ub͕u a: 29ma ọ buru na unu ekupu kwa nka n'irum, ajọ ihe adakwasi kwa ya, unu gēweda isi-awọm rue ala-mọ n'ihe ọjọ. 30Ma ub͕u a, mb͕e m'gābiakute orù-gi, bú nnam, ma nwa-okoro ahu esoghi ayi bia; ebe ekekọtara nkpuru-obi-ya na nkpuru-obi nwa-okoro ahu; 31o gēru kwa, mb͕e ọ huru na nwa-okoro ahu esoghi ayi bia, na ọ gānwu: ndi-orù-gi gēweda kwa isi-awọ orù-gi, bú nna-ayi, rue ala-mọ na nwuta. 32N'ihi na orù-gi nọrọ nwa-okoro ahu mbe n'ebe nnam nọ, si, Ọ buru na emeghm ka ọ biakute gi, eme-hiewokwam megide nnam ubọchi ndum nile. 33Ma ub͕u a, biko, ka orù-gi nọdu n'ọnọdu nwa-okoro a iburu onye-nwem orù; ma ka nwa-okoro a soro umu-nne-ya rigo. 34N'ihi na m'gesi aṅa rigokuru nnam, ma nwa-okoro a esoghm rigo? ka m'we ghara ilekwasi ihe ọjọ ahu anya nke gāchọta nnam.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JENESIS 44: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye