Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 39

39
1Ma emere ka Josef ridata n'Ijipt: Potifa, onye nējere Fero ozi, onye-isi nke ndi-ob͕ū, bú nwoke Ijipt, we b͕a ya n'aka ndi Ishmael, ndi mere ya ka ọ ridata n'ebe ahu. 2Jehova we nọyere Josef, ọ we buru nwoke ihe nāgara nke-ọma; ọ nọ n'ulo onye-nwe-ya, bú onye Ijipt ahu. 3Onye-nwe-ya we hu na Jehova nọyere ya, ọ hu kwa na ihe nile nke ya nēme, Jehova nēme ka ọ ga nke-ọma n'aka-ya. 4Josef we huta amara n'iru ya, we jere ya ozi: ọ me ya onye nēlekọta ulo-ya anya, ọ bu kwa ihe nile o nwere ka o tiyere n'aka-ya. 5O rue, site na mb͕e o mere ya onye-nlekọta n'ulo-ya na onye nēlekọta ihe nile ọ nwere, na Jehova gọziri ulo onye Ijipt ahu n'ihi Josef; ngọzi Jehova we dikwasi ihe nile o nwere, n'ulo na n'ọhia. 6O we rapu ihe nile o nwere n'aka Josef; ọ maghi kwa ihe ọ bula di n'aka ya, ma-ọbughi nání nri nke ya onwe-ya nēri. Josef makwara mma n'aru, ma kwa mma ile anya. 7O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na nwunye nke onye-nwe-ya weliri anya-ya abua lekwasi Josef, si, Ka mu na gi dina. 8Ma ọ juru, si nwunye nke onye-nwe-ya, Le, onye-nwem amaghi ihe di n'akam n'ulo, ọ bu kwa ihe nile o nwere ka o tiyeworo n'akam; 9ọ dighi uku n'ulo a kari mu onwem; o b͕ochighi kwa ihe ọ bula n'ebe m'nọ ma-ọbughi nání gi, n'ihi na gi onwe-gi bu nwunye-ya: m'gēsi kwa aṅa me oké ihe ọjọ nka, mehie megide Chineke? 10O rue, mb͕e ọ nāgwa Josef okwu kwa-ubọchi, na ọ geghi ya nti, idina nso ya, ma-ọbu inọyere ya. 11O rue, dika ubọchi ahu, na ọ bara n'ulo ije ozi-ya; ma ọ dighi onye n'etiti ndikom nke ulo ahu nọ n'ebe ahu n'ulo. 12Nwayi ahu we jide ya n'uwe-ya, si, Ka mu na gi dina; o we rapu uwe-ya n'aka-ya, b͕alaga, pua n'èzí. 13O rue, mb͕e nwayi ahu huru na ọ rapururi uwe-ya n'aka-ya, b͕apu n'èzí, 14na ọ kpọrọ ndikom ulo-ya, gwa ha okwu, si, Lenu, o mewo ka nwoke. Hibru bakute ayi ikwa ayi emò; ọ bakuterem idina-yerem, m'we kpọ nkpu n'oké olu: 15o rue, mb͕e ọ nuru na ewelirim olum kpọ nkpu, na ọ rapuru uwe-ya n'ebe m'nọ, b͕alaga, pua n'èzí. 16Nwayi ahu we debe uwe-ya n'ebe ọ nọ, rue mb͕e onye-nwe-ya batara n'ulo-ya. 17Ọ we gwa ya dika okwu ndia si di, si, Orù Hibru ahu, nke i meworo ka ọ bakute ayi, bakuterem ikwam emò: 18ma o rue, mb͕e m'weliri olum kpọ nkpu, na ọ rapuru uwe-ya n'ebe m'nọ, b͕apu n'ezí. 19O rue, mb͕e onye-nwe-ya nuru okwu nile nke nwunye-ya, nke ọ gwara ya, si, Dika ihe ndia si di ka orù-gi merem; na iwe-ya di ọku. 20Onye-nwe Josef we kuru ya, tiye ya n'ulo-nkpọrọ, bú ebe ndi-nkpọrọ nke eze Ijipt nọ n'ab͕u: o we nọ n'ebe ahu n'ulo-nkpọrọ. 21Ma Jehova nọyere Josef, me ka ebere-Ya rue ya aru, O nye ya amara n'iru onye-isi ulo-nkpọrọ ahu. 22Onye-isi ulo-nkpọrọ ahu we tiye n'aka Josef ndi-nkpọrọ nile ndi nọ n'ulo-nkpọrọ ahu; ihe ọ bula ha nēme kwa n'ebe ahu, ya onwe-ya bu onye nēme ya. 23Ọ dighi ihe ọ bula onye-isi ulo-nkpọrọ ahu nāhu nke di n'aka-ya, n'ihi na Jehova nọyere ya; ihe nke ya onwe-ya nēme, Jehova mere ka ọ ga nke-ọma.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JENESIS 39: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye