O rue, mb͕e nwayi ahu huru na ọ rapururi uwe-ya n'aka-ya, b͕apu n'èzí, na ọ kpọrọ ndikom ulo-ya, gwa ha okwu, si, Lenu, o mewo ka nwoke. Hibru bakute ayi ikwa ayi emò; ọ bakuterem idina-yerem, m'we kpọ nkpu n'oké olu: o rue, mb͕e ọ nuru na ewelirim olum kpọ nkpu, na ọ rapuru uwe-ya n'ebe m'nọ, b͕alaga, pua n'èzí. Nwayi ahu we debe uwe-ya n'ebe ọ nọ, rue mb͕e onye-nwe-ya batara n'ulo-ya. Ọ we gwa ya dika okwu ndia si di, si, Orù Hibru ahu, nke i meworo ka ọ bakute ayi, bakuterem ikwam emò: ma o rue, mb͕e m'weliri olum kpọ nkpu, na ọ rapuru uwe-ya n'ebe m'nọ, b͕apu n'ezí. O rue, mb͕e onye-nwe-ya nuru okwu nile nke nwunye-ya, nke ọ gwara ya, si, Dika ihe ndia si di ka orù-gi merem; na iwe-ya di ọku. Onye-nwe Josef we kuru ya, tiye ya n'ulo-nkpọrọ, bú ebe ndi-nkpọrọ nke eze Ijipt nọ n'ab͕u: o we nọ n'ebe ahu n'ulo-nkpọrọ. Ma Jehova nọyere Josef, me ka ebere-Ya rue ya aru, O nye ya amara n'iru onye-isi ulo-nkpọrọ ahu. Onye-isi ulo-nkpọrọ ahu we tiye n'aka Josef ndi-nkpọrọ nile ndi nọ n'ulo-nkpọrọ ahu; ihe ọ bula ha nēme kwa n'ebe ahu, ya onwe-ya bu onye nēme ya. Ọ dighi ihe ọ bula onye-isi ulo-nkpọrọ ahu nāhu nke di n'aka-ya, n'ihi na Jehova nọyere ya; ihe nke ya onwe-ya nēme, Jehova mere ka ọ ga nke-ọma.