Ha we si na Bet-el bulie ije; ma uzọ fọduru ibiaru Efrat: Rechel we nāmu nwa, ime nēmesi kwa ya ike mb͕e ọ nāmu nwa. O rue, mb͕e ime nēmesi, ya ike, na nwayi nke nēle ime siri ya, Atula egwu; n'ihi na nka bu kwa nwa-nwoke i gēnwe. O rue, mb͕e nkpuru-obi-ya nāpu (n'ihi na ọ nwuru), na ọ kpọrọ aha-ya Ben-oni: ma nna-ya kpọrọ ya Benjamin. Rechel we nwua, elìe ya n'uzọ Efrat (nke ahu bu Bet-lehem). Jekob we guzo ogidi ọtọ n'elu ílì-ya: nke ahu bu Ogidi ílì Rechel rue ta. Israel we bulie ije, seti ulọ ikwū ya n'ofè ulo-elu Ida. O rue, mb͕e Israel biri n'ala ahu, na Reuben jere dinayere Bilha, bú iko-nwayi nna-ya: Israel we nu ya.
Ma umu-ndikom Jekob di iri na abua: umu-ndikom Lia; Reuben, bú ọkpara Jekob, na Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Zebulun: umu-ndikom Rechel; Josef na Benjamin: umu-ndikom Bilha, bú nwayi nējere Rechel ozi; Dan na Naftali: umu-ndikom Zilpa, bú nwani nējere Lia, ozi; Gad na Asha: ndia bu umu-ndikom Jekob, nke amuru nye ya na Padan-eram. Jekob we biakute Aisak, bú nna-ya, na Mamre, bú Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), ebe Abraham na Aisak nọrọ dika ọbìa. Ubọchi Aisak we buru ọgu arọ iteghete. Aisak we kubie ume, nwua, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ, ọ bu agadi, ubọchi-ya jukwara ya afọ: Isọ na Jekob, bú umu-ya ndikom, we lìe ya.