Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 31

31
1Ọ we nu okwu nile nke umu-ndikom Leban, si, Jekob achiriwo ihe nile nna-ayi nwere; o sitekwara n'ihe nna-ayi nwere kpata àkù a nile. 2Jekob we hu iru Leban, ma, le, ọ dighi n'ebe ọ nọ dika ọ di na mb͕e gara aga. 3Jehova we si Jekob, Laghachi n'ala nna-gi-hà, laghachikuru umu-nna-gi; M'gānọyekwara gi. 4Jekob we zìe kpọ Rechel na Lia bia n'ọhia rue ebe ìgwè ewu na aturu-ya di, 5ọ si ha, Mu onwem nāhu iru nna-unu, na ọ dighi n'ebe m'nọ dika ọ di na mb͕e gara aga; ma Chineke nke nnam anọyeworom. 6Unu onwe-unu makwara na ewerewom ikem nile fè nna-unu. 7Ma nna-unu akwawom emò, we b͕anwe ugwọ-olum ub͕ò iri; ma Chineke ekweghi ya mejọm. 8Ọ buru na otú a ka ọ nāsi, Ndi turu agwa gābu ugwọ-ọlu-gi; ìgwè ewu na aturu nile we nāmu umu turu agwa: ma ọ buru na otú a ka ọ nāsi, Ndi dere ọcha gābu ugwọ-ọlu-gi; ìgwè ewu na aturu nile we nāmu umu dere ọcha. 9Chineke we napu anu-ulo nna-unu, nyem. 10O rue, na mb͕e ìgwè ewu na aturu turu ime, na ewelirim anyam abua, hu nime nrọ, ma, le, nkpi nile nke nāb͕a ìgwè ewu dere ọcha, tu kwa agwa, tu kwa akika. 11Mọ-ozi nke Chineke we sim nime nrọ ahu, Jekob; m'we si, Lekwam. 12Ọ si, Biko, welie anya-gi abua, hu, nkpi nile nke nāb͕a ìgwè ewu dere ọcha, tu kwa agwa, tu kwa akika: n'ihi na ahuwom ihe nile Leban nēme gi. 13Mu onwem bu Chineke nke Betel, ebe i tere ogidi manu, ebe i kwerem nkwa: ub͕u a bilie, si n'ala nka pua, laghachi n'ala nke ọmumu-gi. 14Rechel na Lia we za, si ya, Ọ̀ di òkè ma-ọbu ihe-nketa ayi nwere n'ulo nna-ayi ọzọ? 15Ọ̀ bughi na ndi ala ọzọ ka ọ guworo ayi? n'ihi na ọ rewo ayi, ripiasia kwa ego-ayi. 16N'ihi na àkù nile nke Chineke napuworo nna-ayi, ọ bu ayi na umu-ayi nwe nke ahu: ub͕u a kwa, ihe ọ bula Chineke siri gi, me ya. 17Jekob we bilie, palie umu-ya ndikom na ndinyom-ya dọkwasi ha n'elu camel-ya; 18ọ we dupu anu-ulo-ya nile, na àkù-ya nile ọ kpatara, bú anu-ulo o nwetara, nke ọ kpatara na Padan-eram, ilakuru Aisak nna-ya rue ala Kenean. 19Ma Leban jere ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya: Rechel we zue teraphim nke nna-ya nwere n'ori. 20Jekob we ghọb͕ue Leban onye Siria, n'ighara igosi ya na ya nāb͕alaga. 21Ọ we b͕alaga, ya onwe-ya na ihe nile ọ nwere; ọ we bilie, gabiga Osimiri Yufretis, che iru-ya n'ugwu Gilead.
22Ewe gosi Leban n'ubọchi nke-atọ na Jekob b͕alagarari. 23Ọ we chiri umu-nne-ya tiyere onwe-ya, nāchu ya ije nke ubọchi asa, we chukuru ya n'ugwu Gilead. 24Chineke we biakute Leban onye Siria nime nrọ abali, si ya, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ikpayere Jekob uka, ma-ọbu nke di nma ma-ọbu nke jọrọ njọ. 25Leban we rue Jekob aru. Ma Jekob marari ulo-ikwū-ya n'ugwu ahu: Leban na umu-nne-ya makwara ulo-ikwū-ha n'ugwu Gilead. 26Leban we si Jekob, Gini bu ihe i mere, na i ghọb͕uwom, dupu kwa umum ndinyom dika ndinyom eji mma-agha dọta n'agha? 27N'ìhi gini ka i b͕ala-gara na nzuzo, we ghọb͕uem? ọ̀ bụ kwa n'ihi gini ka i nēgosighm, ka m'we were ọṅù, were kwa abù, were kwa egwú-otiti, were kwa ubọ-akwara, zilaga gi? 28ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka inekweghim ka m'sutu umum ndikom na umum ndinyom ọnu? ub͕u a i mewo ihe-nzuzu. 29Ọ diri ike akam imejọ unu: ma Chineke nke nna-unu gwaram okwu n'abali nyahuru, si, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ikpayere Jekob uka, ma-ọbu nke di nma ma-ọbu nke jọrọ njọ. 30Ma ub͕u a, i lawo n'ezie, n'ihi na agu ulo nna-gi gusiri gi ike, ma n'ìhi gini ka i zuworo chim-hà? 31Jekob we za, si Leban, N'ihi na aturum egwu: n'ihi na asirim, Ka i we ghara inapum umu-gi ndinyom n'ike. 32Onye ọ bula i gāchọta chi-gi-hà n'aka-ya, ọ gaghi-adi ndu: n'iru umu-nne-ayi mata ihe nke gi di n'akam, were n'onwe-gi. N'ihi na Jekob amaghi na Rechel zuru ha-ri ori. 33Leban we ba n'ulo-ikwū Jekob, na n'ulo-ikwū Lia, na n'ulo-ikwū orù-ndinyom abua; ma ọ chọtaghi ha. Ọ we si n'ulo-ikwū Lia pua, ba n'ulo-ikwū Rechel. 34Ma Rechel wereri teraphim ahu, tinye ha nime ihe eji anọkwasi camel, we nọkwasi ha. Leban we bitu ulo-ikwū ahu nile aka, ma ọ chọtaghi ha. 35Rechel we si nna-ya, Ya abula ihe iwe iwe di ọku n'anya onye-nwem na apughm ibili n'iru gi; n'ihi na ọ dim dika ọ nādi ndinyom. Ọ we chọsie ike, ma ọ chọtaghi teraphim ahu. 36Jekob we we iwe di ọku, so Leban se okwu: Jekob we za, si Leban, Gini bu njehiem? gini bu nmehiem, na i chuworom n'ọku ọku? 37Ọ bu ezie na i bituwo ihem nile aka, ma gini ka i chotaworo nime ihe nile nke ulo-gi? Tọb͕ọ ya ebe a n'iru umu-nnem na umu-nne-gi, ka ha we kpezie n'etiti ayi abua. 38Orú arọ a ka mu onwem nọyeworo gi; nne-aturu-gi na nne-ewu-gi amukwoghi umu, erighkwa m ebulu nke ìgwè ewu na aturu-gi. 39Nke anu-ọhia dọb͕uru, ewetaghi m ya nye gi; mu onwem nēdochi ya; site n'akam ka i nāchọ ya, ma-ọbu ihe ezuru n'ehihie ma-ọbu ihe ezuru n'abali. 40Otú a ka m'nọworo; n'ehihie ọkpukpọ-nku ririm, ọtutu-oyi rikwara m n'abali; uram we fepu n'anyam abua. 41Orú arọ a ka m'nọworo n'ulo-gi; m'efère gi arọ iri na anọ n'ihi umu-gi ndinyom abua, na arọ isi n'ihi ìgwè ewu na aturu-gi: i b͕anwewo kwa ugwọ-ọlum ub͕ò iri. 42Ọ buru na Chineke nke nnam, bú Chineke nke Abraham, na Oké Egwù nke Aisak, anọghi n'akukum, n'ezie ub͕u a n'aka efu ka i gēzilagawomri. Nweda-n'alam na ndọb͕u m'ji akam abua nādọb͕u onwem n'ọlu ka Chineke huworo, Ọ̀ we bara gi nba n'abali nyahuru. 43Leban we za, si Jekob, Umu-ndinyom ndia bu umu-ndinyom nkem, umu-ndikom ndia bu kwa umu-ndikom nkem, ìgwè ewu na aturu ndia bu kwa ìgwè ewu na aturu nkem, ihe ọ bula kwa gi onwe-gi nāhu, nkem ka ọ bu: ma umum ndinyom, gini ka m'gēmere ndia ta, gini ka m'gēme-kwa-ra umu-ha ndikom ndi ha mutara? 44Ma ub͕u a bia, ka ayi b͕a ndu, mu na gi; ọ gābu kwa ihe-àmà n'etiti mu na gi. 45Jekob we were nkume, guzo ya ka ọ buru ogidi. 46Jekob we si umu-nne-ya, Chikọtanu nkume; ha we were nkume me obo: ha we rie nri n'ebe ahu n'akuku obo ahu. 47Leban we kpọ ya Jega-sahaduta: ma Jekob kpọrọ ya Galeed. 48Leban we si, Obo a bu ihe-àmà n'etiti mu na gi ta. N'ihi nka akpọrọ aha-ya Galeed: 49na Mizpa, n'ihi na ọ siri, Ka Jehova che nche n'etiti mu na gi, mb͕e agēzopu ayi, otù onye n'ebe ibe-ya nọ. 50Ọ buru na i weda umum ndinyom n'ala, ọ buru kwa na i kuru ndinyom tiyere umum ndinyom, ọ dighi onye ayi na ya nọ; le Chineke bu onye-àmà n'etiti mu na gi. 51Leban we si Jekob, Le obo a, le kwa ogidi a, nke m'tob͕ọworo n'etiti mu na gi. 52Ihe-àmà ka obo a bu, ihe-àmà ka ogidi a bu kwa, na mu onwem agaghi-agabiga obo a jekuru gi ma-oli, na gi onwe-gi agaghi-agabiga kwa obo a na ogidi a biakutem ma-ọli, ime ihe ọjọ. 53Chineke nke Abraham, na Chineke nke Nehoa, bú Chineke nke nna-ha, kpe ikpe n'etiti ayi. Jekob we were Oké Egwù nke nna-ya Aisak ṅua iyi. 54Jekob we chua àjà n'ugwu ahu kpọ umu-nne-ya ka ha rie nri: ha we rie nri, nọ ọnọdu-abali n'ugwu ahu. 55Leban we bilie n'isi-ututu, sutu umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom ọnu nke-uku, gọzie ha: Leban we la, laghachi n'ebe nke ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JENESIS 31: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara