Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI GALETIA 2

2
1Mb͕e ahu mb͕e arọ iri na anọ gasiri arigorom na Jerusalem ọzọ, mu na Banabas, m'kpọrọ kwa Taitọs ka mu na ya yikọ je. 2Ma arigorom n'uzọ nkpughe; m'we debe n'iru ha ozi ọma ahu nke m'nēkwusa n'etiti ndi mba ọzọ, ma edeberem ya n'iru ndi akpọrọ ihe mb͕e ha nọ iche, ka m'ghara ibu onye nāb͕a ọsọ ma-ọbu onye b͕arari ọsọ n'efu n'uzọ ọ bula. 3Ma ọbuná Taitọs, onye mu na ya nọ, ebe ọ bu onye-Grik, erugideghi ya ka ebì ya úgwù: 4ma n'ihi umu-nna ugha ndi ekubatarari na nzuzo, madu ndi b͕ebatara ka ha ledo inwe-onwe-ayi nke ayi nwere nime Kraist Jisus, ka ha we me ka ayi buru orù: 5ndi ayi nēnyeghi uzọ n'uzọ ido onwe-ayi n'okpuru ha, é-è, ọ bughi otù oge hour; ka ezi-okwu nke ozi ọma we nọgide n'etiti unu. 6Ma site n'ọnu ndi akpọrọ ihe (aha madu ha buri n'oge gara aga, o meghi ihe di iche n'anyam: Chineke adighi-ele madu anya n'iru) asim, na ndi ahu akpọrọ ihe enyeghm ìzù ọ bula: 7kama n'akuku ọzọ, mb͕e ha huru na enyereri ozi ọma nke ndi ebìghi-úgwù n'akam na ntukwasi-obi idebe, dika enyereri Pita ozi ọma nke ndi obibi-úgwù n'aka idebe 8(n'ihi na Onye lusiri Pita ọlu ike ka ọ we lua ọlu onye-ozi nke ndi obibì-úgwù, Onye ahu lusikwara m ọlu ike ka m'we jekuru ndi mba ọzọ); 9mb͕e ha hukwara amara enyerem, Jemes na Kifas na Jọn, bú ndi akpọrọ ide, nara mu na Banabas aka-nri nke nnwekọ, ka ayi onwe-ayi we jekuru ndi mba ọzọ, ka ha onwe-ha we jekuru kwa ndi obibì-úgwù; 10ọ bu nání na ha chọrọ ka ayi cheta ndi-obeye; nke m'nuru ọku n'obi ime otù ihe ahu.
11Ma mb͕e Kifas biaruru Antiọk, eguzogiderem ya n'iru, n'ihi na ọ nọ n'ọmuma-ikpé. 12N'ihi na mb͕e madu ufọdu akēsighi n'ebe Jemes nọ bia, ya na ndi mba ọzọ nērikọ ihe: ma mb͕e ha biara, o wezugabara we kewapu onwe-ya, ebe ọ nātu egwu ndi obibì-úgwù. 13Ndi-Ju fọduru we so ya n'inwe kwa iru-abua; nke mere ka iru-abua-ha dọrọ Banabas onwe-ya iso ha. 14Ma mb͕e m'huru na ha agazighi dika ezi-okwu nke ozi ọma si di, asirim Kifas n'iru ha nile, Ọ buru na gi onwe-gi adi ndu dika ndi mba ọzọ, ma ọ bughi dika ndi-Ju, ọ bu ezie na i bu onye-Ju, ì si aṅa erugide ndi mba ọzọ ka ha so uzọ ndi-Ju? 15Ayi onwe-ayi, ọ bu ezie na ayi bu ndi-Ju dika esi mu ayi, buru kwa ndi nābughi ndi-nmehie ndi sitere na ndi mba ọzọ, 16ma ebe ayi matara na agughi madu n'onye ezi omume site n'ọlu di iche iche nke iwu, ma ọ bu nání okwukwe ekwere na Jisus Kraist ka eji gu madu n'onye ezi omume, ọbuná ayi onwe-ayi kwere na Kraist Jisus, ka ewe gua ayi na ndi ezi omume site n'okwukwe ayi kwere na Kraist, ọ bughi kwa site n'ọlu di iche iche nke iwu: n'ihi na site n'ọlu di iche iche nke iwu ọ dighi anu-aru ọ bula, bú madu, agāgu n'onye ezi omume. 17Ma ọ buru na ahuru na ayi onwe-ayi bu kwa ndi-nmehie, mb͕e ayi nāchọ uzọ agēsi gu ayi na ndi ezi omume nime Kraist, ọ̀ bu na Kraist bu onye nēje ozi nmehie? Chineke ekwela. 18N'ihi na asi na ihe m'kwaturu, ihe ndia ka m'nēwuli elu ọzọ dika ulo, anameme ka madu mara na abum onye-njehie. 19N'ihi, na mu onwem sitere n'aka iwu nwua n'ebe iwu di, ka m'we di ndu n'ebe Chineke nọ 20Akpọgidekọwo mu na Kraist n'obe; ọ bughi kwa mu onwem nādi ndu ọzọ, kama ọ bu Kraist nādi ndu nimem ma ndu ahu m'nādi n'anu-aru ub͕u a, anamadi ya n'okwukwe, bú nke m'kwere n'Ọkpara Chineke, Onye hurum n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihim. 21Ajughm amara nke Chineke: n'ihi na asi na ezi omume abia site n'aka iwu, ya mere Kraist nwuru n'efu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

NDI GALETIA 2: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara