Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

EZRA 5

5
1Ma ndi-amuma, bú Hagai onye-amuma, na Zekaraia nwa Ido, buru amuma nye ndi-Ju ndi nọ na Juda na nime Jerusalem; ọ bu n'aha Chineke Israel ka ha buru amuma nye ha. 2Mb͕e ahu Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua nwa Jozadak, biliri, we malite iwu ulo Chineke nke di na Jerusalem; ndi-amuma Chineke nọye-kwa-ra ha, nēnye ha ume. 3Na mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, biakutere ha, we si ha otú a, Ònye nyere unu iwu iwu ulo a, na iluzu mb͕idi a? 4Mb͕e ahu otú a ka ayi siri ha. Ha siri, Òle aha ndi nēwu ulo a anēwu? 5Ma anya Chineke-ha di n'aru ndi-okenye ndi-Ju, ha we ghara ime ka ha kwusi, rue mb͕e okwu ahu jeruru Daraiọs nti: mb͕e ahu ha we zighachi akwukwọ-ozi bayere ihe a.
6Ndeputa akwukwọ-ozi nke Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ya, bú ndi-Afasakait, ndi nọ n'ofè osimiri, zigara Daraiọs, bú eze. 7Ha zigara ya akwukwọ, otú a ka ede-kwa-ra nime ya; Daraiọs, bú eze, nwe akwukwọ a, udo nile diri ya. 8Ka eze mara, na ayi jere n'ala anāchi achi, bú Juda, rue ulo Chineke uku, ma anēwere nkume nkpọrè wue ya, anēdo kwa osisi nime mb͕idi, anālu kwa ọlu a ọsọsọ, ọ nāga kwa nke-ọma n'aka-ha. 9Mb͕e ahu ayi juru ndi-okenye ahu, si ha otú a, Ònye nyere unu iwu iwu ulo a, iluzu mb͕idi a? 10Ọzọ kwa, ayi juru ha aha-ha, ime ka i mara, ka ayi we de aha ndikom ahu ndi bu isi-ha n'akwukwọ. 11Ma otú a ka ha zaghachiri ayi okwu, si, Ayi onwe-ayi bu ndi-orù nke Chineke nke elu-igwe na uwa, ayi nēwu kwa ulo nke ewuru ọtutu arọ gara aga site na mb͕e a, nke otù eze uku nke Israel nwere wuru, wuzu kwa. 12Ma mb͕e nna-ayi-hà kpasusiri Chineke nke elu-igwe iwe, O nyere ha n'aka Nebukadneza, bú eze Babilon, onye Kaldea, o we me ka ulo a la n'iyì, o me-kwa-ra ka ndi-ayi je biri na Babilon. 13Ma n'arọ mbu nke Sairọs, bú eze Babilon, Sairọs, bú eze, nyere iwu iwu ulo Chineke a. 14Ọzọ kwa, ihe nile nke ulo Chineke, nke ọla-edo na nke ọla-ọcha, nke Nebukadneza chiputara n'ulo uku Chineke di na Jerusalem, chibata ha n'ulo uku nke Babilon, ihe ahu ka Sairọs, bú eze, chiputara n'ulo uku Babilon, nye ha n'aka otù onye, Sheshbaza bu aha-ya, onye o mere onye nāchi ala; 15ọ si ya, Chiri ihe ndia, je, dọba ha n'ulo uku Chineke ahu nke di na Jerusalem, ka ewu kwa ulo Chineke n'ọnọdu-ya. 16Mb͕e ahu Sheshbaza ahu biara, tọ ntọ-ala nile nke ulo Chineke nke di na Jerusalem: ma site na mb͕e ahu we rue ub͕u a ka anēwu ya, ma ewuzughi ya. 17Ma ub͕u a, ọ buru na ọ di eze nma, ka achọ n'ulo àkù eze, nke di n'ebe ahu nime Babilon, ma ọ bu ezie na esitere n'aka Sairọs, bú eze, nye iwu iwu ulo a nke Chineke nime Jerusalem, ka eze zite-kwa-ra ayi ihe nātọ ya utọ bayere okwu a.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

EZRA 5: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye