Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

EZIKIEL 4

4
1Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were n'onwe-gi otù brick, tọb͕ọ ya n'iru gi, kà otù obodo n'elu ya, bú Jerusalem: 2tiye ihe-nnọchigide-n'agha imegide ya, wue ulo-agha imegide ya, wukọta obo-ihe imegide ya; tiye ọmuma-ulo-ikwū di iche iche imegide ya, do ihe di iche iche itipú mb͕idi imegide ya buruburu. 3Gi onwe-gi were kwa n'onwe-gi ite ígwè ighe ihe, tiye ya ka ọ buru mb͕idi ígwè n'etiti gi na obodo ahu: che ya iru, ewe nānọchigide ya n'agha, i gānọchigide kwa ya n'agha. Ihe-iriba-ama ka ọ gāburu ulo Israel.
4Ọzọ, gi onwe-gi were akuku aka-ekpe gi dina ala, tukwasi-ya ajọ omume ulo Israel: ka ọnu-ọgugu ubọchi ra nke i gēwere ya dina ala, i gēbu ajọ omume-ha. 5Ma Mu onwem, edoworom i arọ nile nke ajọ omume-ha ibu ọnu-ọgugu ubọchi, bú ọgu ubọchi iri-na-iteghete na iri: i gēbu kwa ajọ omume nke ulo Israel. 6Ọzọ, mb͕e i dinazuworo ubọchi ndia, i gēwere kwa akuku aka-nri gi dina ala, we buru ajọ omume nke ulo Juda: ọgu ubọchi abua, otù ubọchi n'ọnọdu otù arọ, ka M'nyeworo gi. 7Ọ bu kwa n'ebe nnọchigide Jerusalem n'agha ahu di ka i gēche iru-gi, ogwe-aka-gi ab͕awo kwa ọtọ; i gēbu kwa amuma megide ya. 8Ma, le, atukwasim i udọ̀, i we ghara isi n'otù akuku-aru-gi chighari n'akuku-aru-gi ọzọ, rue mb͕e i dinazuworo ubọchi nile nke nnọchigide-n'agha-gi. 9Ọzọ, gi onwe-gi were n'onwe-gi ọka wheat, na ọka barley, na akidi, na lentil, na ọka millet, na spelt, tiye ha n'otù ihe, were ha mere onwe-gi achicha; ka ọnu-ọgugu ubọchi ra nke gi onwe-gi were akuku-gi dina ala, bú ọgu ubọchi iri-na-iteghete na iri, ka i gēri ya. 10Ọzọ, ihe-oriri-gi nke i gēri, aganātù ya atù, orú shekel gādiri otù ubọchi: site n'otù mb͕e rue mb͕e ọzọ ka i gēri ya. 11Ọ bu kwa miri nke anātù atù ka i gāṅu, otù uzọ n'uzọ iri nke otù hin: site n'otù mb͕e rue mb͕e ọzọ ka i gāṅu ya. 12Ọzọ, dika ob͕e achicha barley ka i gēri ya, achicha ahu ka i gēji kwa ǹsí madu nyuru sie n'anya-ha. 13Jehova we si, Ọbuná otú a ka umu Israel gēri nri-ha ruru árú, n'etiti mba nile ebe M'gāchuga ha. 14M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, emerughi nkpuru-obim: erighkwam ihe nwuru n'onwe-ya, ma-ọbu ihe anu dọb͕uru, site na mb͕e m'di na nwata we rue ub͕u a; ọ dighi kwa anu nke bu ihe-árú bàworo n'ọnum. 15O we sim, Le, enyewom i ǹsí ehi n'ọnọdu ǹsí madu, i gēme kwa achicha-gi n'elu ya. 16O we sim, Nwa nke madu, le, M'gaje ib͕aji nkpa-n'aka, bú achicha, nime Jerusalem: ha ewe rie achicha n'ọtùtù na nime ncheb͕u; ha gāṅu kwa miri n'ọtùtù na n'anya ọ nēju ha: 17ka nri na miri we kọ ha, ka o we ju kwa ha anya, otù onye n'aru ibe-ya, ha ewe ta aru n'ajọ omume-ha.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

EZIKIEL 4: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye